Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nchegbu N'efuIhe Atụ

Anxious For Nothing

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Ọ̀ dịtụla mgbe obi na-ama gị ikpe maka ịbụ Onye Nke Kraịst nke di “n'echegbu onwe ya” maka ihe”? Inwe nchegbu ọ na-enyekwu gị nchegbu n'ihi na iche na ikwesịghi ina enwe mmetụta maka ya? Lori nọ n'otu ụgbọ mmiri ahụ rụọ mgbe ọ chọpụtara otu ihe nke gbanwere ihe niile.

Alụmdi na nwunye m nọ n'ọgba aghara. Ana m arụ ọrụ niile nke ịzụ ụmụ atọ, abụọ n'ime ha bụ ndi afo iri na ụma (Onye-nwe-anyị, nyere m aka!) ihe niile ndia ka m n'eme n'onwe m. Ịrụ ọrụ, isi nri, ihicha ihe, ịkwọ n'ụgbọ ala, imezi ihe, ime ihe ego, ịkwadọ, ịhụ ndi m n'anya, inye ihe—o bụ n'isi m ka ha niile di. Nchegbu m rigọrọ elu nke ukwuu, mana amaghị m ihe m ga-eme banyere ya.

Anọ m n'agbalị ike m n'ihe niile m nwere ike iche maka ya: ndụmọdụ, ida obi juu site n'enweghi mkpọtụ, iñu ọgwụ, ige egwu, mmgbati ahụ, ịgụputa Akwụkwọ Nsọ, kpọọ ya aha! Ọ dịghị ihe yiri ka ọ ga-ewepụ ya. Atakwala m ụta, ime ihe ndi a di ezigbo nyere-aka. Amụtara m iji ngwá ọrụ dị m mkpa iji mee ka onwe m dabere na Kraịst ọzọ. Mana agbanyeghi ihe ndi a aka m n'agba mgba. N'ileghachi anya n'azụ, otu ihe m ghọtara m na-adighị eme bụ "mụ adọgbụzina onwe m.”

Ọ bụrụ na ịchọọ n'ime Akwụkwọ Nsọ, ị ga-ahụ ọtụtụ amaokwu gbasara nchegbu. Amaara m nke a n'ihi na m nọ na-achọ usoro anwansi ga enyere m aka iji wee merie ya ozugbo makwa ka ọ ghara inye m nsogbu ọzọ. N'ọchịchọ m, ahụrụ m ihe m na-atụghị anya ya. Ị ga-ele ezigbo anya ka i wee hụ ya, ma n'amaokwu ndị a, e nwere ntụziaka ndi dọrọ anya sitere n'aka Nna anyị ka anyị ghara ime ihe ọ bụla. Ee, n'eziọkwu —emele ihe ọbula.

Na Matiu 11:28 NIV, Jizọs kwụrụ sị: “Bịakwutenụ M, unu niile ndị ike gwụrụ na ndị eboro ibu dị arọ, Aga M emekwa ka unu zụrụ ike.” Ọ bu Ya na-arụ ọrụ ebe a, ọ bụghị anyị. Naani ihe anyi ga-eme bụ ibịakwute Ya.

Na Jọn 14:27 NIV, Jizọs kwụrụ si, "Udo ka M na-ahapụrụ gi; udo M ka M na-enye gị …” Ị na-ahụta isiokwu? Ọ na-enye anyị udo. Ọ na-enye anyị ezu m ike. Anyị anaghị eme ihe ọ bụla.

Ọzọkwa na Matiu 6:25-34 NIV, akụkụ akwụkwọ nsọ a ama ama na-agwa anyị ka anyị ghara ichegbu onwe anyị, n'ihi na Chineke “na-eyikwasị ahịhịa ndụ dị n'ubi uwe,” ya mere, Ọ gaghi elekọta anyị anya karịa? A gwara anyị ka anyị “buru ụzọ chọọ alaeze Ya … na ihe ndị a niile ka a ga-enye” anyị. Nke ahụ bụ eziokwu— ị nwetara nke ahụ? A ga-enye

Chineke bụ Onye na-enye ihe. Ọ nwere azịza anyi n'achọ, Ọ nọgidesikwara anyi ike. Ụfọdụ ihe anyị na-enweghị ike ime n'onwe anyị, ma nke ahụ bụ kpọmkwem otú Ọ si hazie ya. Ka anyi chọọ Ya.

Ihe ndị ahụ niile m na-enwe nchegbu banyere ha gazikwara, otu ụzọ ma ọ bụ uzo ọzọ. Ọbughi rụọ mgbe m kwụsịtụrụ kụọ ume, zụọ ike, bịakwụte Jizọs n'ezie, di na-ngbachi nkịtị, hapụsia nkọwa niile, gwa Chineke na m tụkwasịrị Ya obi kpamkpam—ma mụta idi emeghi ihe ọ bụla—ka m mesịrị nweta udo. N'ikpeazụ, ekpere m bịara belata maka ọnọdụ m ma karịa maka ntụkwasị obi m na Ya.

Ọ bụrụ na ọ dị gị mkpa ime otu ahụ, a na m agba gị ume ka ị zuru ike n’ime Ya. Ị nwere ike ịtụkwasị Ya obi. Nke a bụ ihe m na-ekpe n'ekpere mgbe m na-enwe mmetụta nke oke nchegbu ọzọ:

Ezigbọ Onye-nwe-anyị,

Abịakwutere m Gị taa ịrịọ maka enyemaka. Ị bụ ihe m niile. Onye-nwe-anyị, achọrọ m ezu m ike. Ana m enye Gị nchegbu m. Were ya, Onye-nwe-anyị. Ana m anabata udo, ihunanya na nghọta Gị. Nyere m aka ka m dewe ihu ebe Ị nọ n'abughi ebe m nọ. Nyere m aka ka m kwụsị ime ma malite itụkwasị obi. Nyere m aka ichere azịza Gi, n'ihi na amaara m na ha di nma. Nye m amamihe, olile-anya, na udo. Daalụ, Onye-nwe-anyị, maka ndidi na amara Gị. Ahụrụ m Gị n'anya, amakwa m na Ị hụrụ m n'anya karịa ka m nwere ike iche.

Amen.

-Lori

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Anxious For Nothing

Ma ọ bụrụ na e nwere ụzọ ka mma ịlụso nchegbu na-adịghị agwụ agwụ na-eme ka ị na-ehi ụra n'abalị? Ezi ezumike dị—ma nwere ike di nso karịa ka ị chere. Jiri udo dochie ụjọ site na atụmatụ Akwụkwọ Nsọ ụbọchị asaa a sitere na Life.Church, na-esote usoro ozi Pastọ Craig Groeschel Nchegbu N'efu.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/