Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Atụ
Okweghị m echena na ọ nwere ike anyị anọwo na-ele Akwụkwọ Nsọ anya n’ụzọ na-ezighị ezi. Eleghị anya, anyị aghọtaghi ma oli otú akwụkwọ ochie si edozi ajụjụ anyi banyere akụkọ ihe mere eme, omenala, sayensị na omume anyị nke mere na obi abụọ aghọwo ihe a na-apụghị izere ezere. Ma gịnị ka ọ ga-apụta ma ọ bụrụ na isi ebumnobi ya abụghị igosipụta amamihe kwụrụ chim kama ọ bụ ime ka anyị na Chineke na-enwe mmekọrịta na-aga nke ọma?
Eleghị anya ọ dị ka anyị ga-ahapu iji ọgbara ọhụrụ ele Akwụkwọ Nsọ anya (Olee otú ọ si bụrụ ihe ezi uche?) ma ọ bụ iji ngafe nke ọgbara ọhụrụ ele ya anya (Olee otú ọ si agwa m okwu?). Eleghị anya anyị kwesịrị ịnakwere ya maka ihe ọ bụ: akwụkwọ nke ana apụghi ighọtazụ, gbara gharịị, siri ike, nke na-ama aka, na-akpali akpali, na-akpọ òkù, na emebisi ihe ma ọ bụ ebe ndị akwuru chim, nsafe akwụkwọ na nsafe akwụkwọ, akụkọ na akụkọ, na-ejedebe n'ụdị mmadu bụ Jizọs.
Ma ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, yabụ dịka mmekọrịta ọ bụla, ọ na-ewe oge.
Ntachi obi bụ ihe di mkpa anyi ga-eji gwụọ gafee elu ochie ya, nke dị okwụte okwụte, ma site n'nke ahu wee kpụghee eziokwu.
Oke ịdị umeala n’obi bụkwa ihe di mkpa anyi ga-eji chegharịa echiche anyị mgbe nke ahụ mere.
Uzọ ọ bụla ọ si di, enwere m udo n'ịmara na ndị dere ya bụkwa ndị nweere ya obi abụọ. Ha gbakwara mgba. Ma ha nọgidere na-eje ije n’ụzọ Emmaus ahu, n’ihi na ha kwenyere na n’ikpeazụ ọ bara uru. Ha nwere olileanya na otu ụbọchị, n’ụzọ ana atụghi anya, ha ga-ahụ Mezaịa ha.
Ma nke ahụ bụ ihe na-eme ka Akwụkwọ Nsọ a bụghị naanị ihe a ga-atụkwasị obi, ọ bụkwa ihe a ga-eji ebi ndụ ka ana aga.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.
More