Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Atụ
Akụkọ banyere mgba Jekọb na Chineke gbara bụ ihe ngosi mara mma nke ihe okwukwe miri emi yiri. Okwukwe miri emi bụ mmekọrịta di ezigbo omimi, nke siri ike, nke ndụ niile, nke igba ahiri, nke ọbara, nke mgbe ụfọdụ ọ dịghị piam piam, nke bụ ezigbo nhụta anyi na Chineke na-enwe mgbe niile. Okwukwe abụghị ihe edere ka aga esi wee mee ya; ọ bụ ute mgba. Ọ pụtara iwere egwu gị niile, mmehie gị niile, enweghị ntụkwasị obi gi niile, na obi abụọ gi niile ma gaa n'ihu gị na Chineke ana asọ mpi. Ee ee, ị nwere ike ịmeru ahu ma tụfuo nganga gị. Ma ọ ka mma ịbụ ezigbo onye n'ejikwaghi ihe ọbụla n’ihu Chineke karịa ịbụ onye okpukpe ụgha.
Okwukwe pụtara ịjiri ihe gi niile wụbanye.
Ọ bụrụ na ịchọrọ okwukwe miri emi, na abụghị naanị okwukwe nke nne na nna gị, ndị enyi gị, ma ọ bụ ụka, kama okwukwe nke na-agbanwe gị ma mee ka ị dị ndụ, nke ahu pụtara na e nweghị ụzọ ọzọ. . . . Na Ndị Galeshia 6:16, Pọl kwuru na anyị bụ “Izrel nke Chineke.” N'ikwu ya n'ụzọ ọzọ, n'ihi na ihe nketa ime mmụọ anyị jupụtara na ndị ha na Chineke gbara mgba, akpọkwara anyị ka anyị bụrụ ndị na agba mgba.
Naanị otu ụzọ Jekọb nke dị n'ime anyị ga-esi ghọọ Izrel, naanị otu ụzọ okwukwe anyị ga-esi too, bụ ma ọ bụrụ na anyị ewetara Chineke ihe niile anyị bụ. Ihe niile. Nke ahụ gụnyere obi abụọ anyị. Nke kasi mkpa iweta bụ obi abụọ anyị. . . .
Okwukwe na-eto eto ka ọ na-agafe nke nchekwa na nke enwere ike ima gbasara ya ma banye n'ime ebe di ọchịchịrị, ebe obi abụọ jupụtara. Okwukwe jụrụ ibelata olileanya gị nye otu egwu gị ha. Okwukwe anaghị ezọnari ajụjụ kama ọ na-eji obi ya nille alụsọ ha ọgụ. . . .
Akwụkwọ Nsọ abụghị akụkọ nke ndị ji ume ngwu nagide obi abụọ; ọ bụ maka ndị mmadụ ji obi siri ezigbo ike lụso obi abụọ ha ọgụ. Obi rere ha ọkụ maka ihe karịrị naanị ihe di obere, n'enweghị ndụ, nke okwukwe di uzo abụọ. Socrates kwuru, "Ndụ a na-enyochaghị enyocha abaghị uru obibi." Ndị dere akwụkwọ Nsọ na ndị dike nke Akwụkwọ Nsọ siri ọnwụ na okwukwe a na-enyochabeghị enyocha ekwesịghị nkwere.
Ya mere, isi n’isi, amaokwu n’amaokwu, ha ji nkwuwa okwu, obi inụ ọkụ, na atụghị egwu gbasoo Chineke ha mgba. Olu ha kwọchasiri akwọchasi tiri mkpu, "Agaghị m ahapụ Gị ka Ị laa ma ọ buru na Ị gọzighi m!" Ha maara na ọ ga-esi ike ma dị egwu, mana ọ bara uru kwa sekọndụ ọ bụla.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.
More