Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Atụ

When Faith Fails: 10 Days Of Finding God In The Shadow Of Doubt

ỤBỌCHỊ 6 NKE 10

Ákwá-arịrị bụ iti-mkpu nke obi tiwara etiwa, nke n'enweghi mmekwa, nke di agwọchaghi ngwọcha. Ọ na-ele nhụjuanya anya, akụkụ ya ndị gbagọrọ agbagọ a na-emeru ya ahụ, ọ na-adaghari adaghari, na-ebe ákwá, na-eti mkpu maka ikpe ziri ezi. Ákwá-arịrị anaghị anabata azịza ndị na-emighị emi, ndị edebere edebe, ndị dị mfe. Ọ na-achọ ezigbo eziokwu di ike makwa ọ naghị atụ egwu ajụjụ ndị a na-enweghị ike ịza.

Ákwá-arịrị bụ abụ nke mkpụrụ obi nwere obi abụọ.

Otú ọ dị, anyị bi n'ọgbọ, mgbe ákwá-arịrị dara n'oge ihe siri ike. Anyị amaghị otú anyi ga-esi mee iru uju. Anyị na-ahọrọ ngọnarị. Anyị bụ mba kacha aṅụ ọgwụ. Ihe oyiyi na akụkọ ndi banyere nhụjuanya na-enye anyi nsogbu. Ihe ndị egwuregwu eji atụrụndụ na ihe ndi onyonyo na-adọpụ uche emeele ka anyi ghara inwe mmetụta ọbụla maka nhụjuanya. Ibi ndụ oma n'egbuzi anyi ka mmanya. Mana, mgbe nhụjuanya meghere ajụjụ ndị di ekweghi ekwe banyere Chineke na ndụ, anyị na-akpagbu ma na-ezochi ya. Mana nke ahụ agaghi adi rụọ ogologo oge. Dị ka osimiri nke na-acho igafe oke ya, anyị nwere ike ịgọnarị ma ọ bụ gbalịsie ike ijide ide mmiri na-abịanụ ma ọ bụ mụta otú e si ebi ndụ n'ime mmiri miri emi.

Akwụkwọ Nsọ na-agupụta n'akụkọ banyere ndị nwoke na ndị nwanyị mere otu ahụ. Ha hụrụ ihe ndị na-eme gburugburu ha, ha kpọrọ ikpe na-ezighị ezi ndị ahu aha, ma tikuo Chineke ka Ọ kọwaa onwe Ya. Devid tiri mkpu si, “Rùe ole mgbe, Onye-nwe-anyị?” (Abụ Ọma 13:1). Jeremaịa, bụ onye ezigbo ike gwuru maka mmegbu ọ hụrụ, rịọrọ Chineke ka Ọ mee ihe. Job nwere nkụda mmụọ. Jekọb gbara mgba. Moses mara aka. Ebreham nwere obi abụọ. Mary jụrụ ajụjụ. Jizọs kwara ákwá.

Ákwá-arịrị abụghị ihe mgbochi nke okwukwe; otú ahụ ka okwukwe na-adị mgbe ọ na-eru uju nso. Ka anyị na-ekwenyesi ike n'ịdị mma nke Chineke, ka anyị na-eme mkpesa siri ike mgbe ekpuchiri ịdị mma Ya.

Ọ bu ya mere Jizọs ji kwaa akwa n’ili enyi Ya.

Ọ nweghị ihe omere ma anyi nye owu ọmụma anyị olu. Ọ nweghị ihe omere ma anyị tiputa mkpesa anyị. Ọ nweghị ihe omere ma anyị wee iwe.

Ọ nweghị ihe omere ma ọ bụrụ na anyi enwetaghị azịza niile.

Chineke ka na-agbakwuru anyị, makụọ anyị, na-esokwa anyị akwa ákwá n’ebe ahụ. Mgbe ahụ, site n'anya mmiri anyị, anyị na-achọpụta na Onye na-akwa ákwá nwere aka emerụsiri ahụ. Ahụ ya tiwara etiwa. Ihu ya adighị nma ile anya.

Anyị aghọta na Ya Onye Ya atawọkwa ahụhụ.

Ụbọchị 5Ụbọchị 7

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

When Faith Fails: 10 Days Of Finding God In The Shadow Of Doubt

Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.

More

Anyi ga-achọ ikele HarperCollins maka inye atụmatụ a. Maka ozi ndi ọzọ, biko gaa na: http://bit.ly/2Pn4Z0a