Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Atụ
Dị ka ndị mbụ soro ụzọ Jizọs, a kpọwo gị n’akụkọ karịrị nke gị. Ndụ gị jụpụtara na nzube. Ekère gi ịmata na iso Ya. Nke a na-agụsi gị agụụ ike. Ma onye ọ bụla n'ime anyị, ndị na-efe ofufe na ndị nwere obi abụọ, ka a na-akpọ òkù isonye.
Ọ na-akpọ ndị na-eso ụzọ Ya ndị okwukwe ha na-adịghị ka ọ nwere mgbe ọ na-ada. Ọ dị ka ha kwenyere mgbe niile, na-agu abụ Hillsong n'afọ nne ha, ha akwụsịbeghịkwa kemgbe ahu. Ma Ọ na-akpọkwa ndị na-enwe obi abụọ. . . . Ndị nwere ihe mgbu na-enweghị mgbagha maka mmekọrịta di omimi n'ihi na ha enweghị ike ịnabata okwukwe nke na-abụghị nke ha.
Jizọs nabatara ha abụọ. A kpọro ha abụọ. E zigara ha abụọ. Ha abụọ dị mkpa maka mgbanwe Ọ malitere.
N'agbanyeghị ebe ị nọ na njem okwukwe gị, Ọ na-akpọkwa gị.
Eleghị anya, ị nọ n'ebe dị anya n'ebe ụlọ gi nọ, makwa ị maghị ihe ma ọ bụ ma ị kwenyere ọzọ. Ọ nwere ike bụrụ na ị gafeela oge mgbarisi ihe gbasara okwukwe ma ugbu a ị na-enyocha ala nke obi abụọ, gi na ajụjụ ndị kasị sie ike ná ndụ a na-akparita. Ma ọ bụ ikekwe ị nọ n'uzo ilọta ụlọ. Mmekọrịta gị na Chineke dị iche karịa ka ọ dịbụ, mana ọ ka mma n'ụzọ ụfọdụ. Ọ bara oke ime. Dị ndụ karia.
Ebe ọ bụla ị nọ, na ihe ọ bụla ị na-eche banyere Chineke, ohere na-adịghị agwụ agwụ dị n'ihu gị. Okwu mbụ edere nke Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ Ya bụ, “Bịa, soro M,” okwu ikpeazụ Ya bụkwa otu ihe ahu. Na-aga n'ihu. Na-achụso eziokwu.
Ihe ize ndụ kasịnụ abụghị na anyị tụfuru okwukwe anyị kama na anyị na-anabata ụdị ya n'adighị ezigbo nma. Ụbọchị ọ bụla bụ ohere ịjụ, ichọ, ikụ aka. Enwere ọtụtụ ihe ndi ọzọ ị ga-enyocha. Enwere ọtụtụ ihe ndi ọzọ ị ga amụta. Enwere ọtụtụ ihe ndi ọzọ ị ga amikpụnye n'ime gi. Enwere ọtụtụ ugwu gbagọrọ agbagọ ị ga-arị, ihe ndi ịma aka ị ga-emeri, ebe ndi sara mbara ị ga-elebanye anya, ahụmahụ ihe ndi mara mma ị ga-enwe. Chineke nke ị ga-ama.
Ị ka na-amalite.
Ma mgbe obi gị na-ama jijiji, mgbe ikpere gị na-ada mba, na mgbe okwukwe gị dara ada, cheta na i nwere olileanya a:
Jizọs nwe okwu nke ikpe-azụ.
Ị chọrọ imikpụnyekwụ? Nweta akwụkwọ Dominic Mgbe Okwukwe Dara Mba ịmatakwu gbasara obi abụọ na okwukwe.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.
More