Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Atụ
Ọ bụrụ na ụlọ bụ ndụ nke okwukwe, ọ pụtara na obi abụọ bụ ụzọ anyị ga-eje ije iji ruo ebe ahụ. N'ezie, enwere ihe ịma aka ndi jupụtara n'ụzọ ahụ: ọnyà, owu ọmụma, iwe, egwu, ajụjụ. Okwu ahu bụ ajụjụ sitere na nke Latin bụ quaerere, bụ ebe anyị si nweta okwu bụ quest. Ije ọchịchọ, dị ka njem ọchịchọ ọ bụla, jupụtara na ihe mgbochi. Ihe ọbụla ekpebiri ime nwere ihe ọna efunariri onye n'eme mkpebi ahụ. Ugwu ndị ahụ na-afụ ezigbo ụfụ ịrịgo. Itachi obi n'ime ndagwurugwu bụ ihe ita oke ahụhụ. Nye ọtụtụ ndị mmadụ, nke ahụ bụ otu ịla n'ụlọ dị. Ndị ọzọ m maara (ana m enwere ha anyaụfụ) na-enwe oge dị mfe karịa. Ụzọ ha ga-esi laa bụ okporo ụzọ buru ibu awara n'uzo anọ; banye n'ụgbọ ala ma gị abịarute. Ụfọdụ, dị ka mụ onwe m, nọ n'ụzọ ihe ile anya mara mma jupụtara.
Mana n'uzo ọ bụla, anyị na-erute ebe ahụ.
Nakwa n'ụzọ ọ bụla, anyị anọghị naanị anyị. . . .
Anyị nwere mgbagwoju anya na owu ọmụma, na-agbatị n'ike n'ike n'ime mkpọmkpọ na-achọ nzube. Enyere anyị edemede abụọ. Otu kwuru na ọ nweghị ihe ndụ pụtara. Na ihe niile bụ ihe mgberede. Ihe na-eme. Ma ka ana ekwu, ị bụkwa ihe mgberede.
Ma Jizọs na-enye anyị edemede ọzọ. Ọ na-ekwu na ndụ nwere isi. Na ihe niile gbasara onye ị bụ, ume ina eku n'ngụgụ gị, obi na-akụ n'ime obi gị, anya mmiri gị, egwu gị, na nrọ gị, bara uru. Ọ na-ekwe nkwa na ikpe ziri ezi ga-achị, ebere ga-emeri, ihe e mebiri emebi ka aga-ewughachi; Ọ na-akpọkwa anyị òkù ka anyị soro Ya otu kacha mma anyị si mara.
Ụfọdụ na-ekwu na nke a abụghị ihe ọzọ karịa echiche efu. Ma, onye makwanu, eleghị anya ha n'ekwu eziokwu. Eleghị anya anyị bụ ndị ara, ndị n'enweghị uche. Ma ọ kaara mụ mma ibi ndụ m n’olileanya, na-achọ Chineke mara mma, karịa ibi n’ihe mgbu na ihe efu nke ụwa nke na-adịghị asọpụrụ Chineke.
Ekwere m na e nwere ihe dị adị n'ibi n'uwa a karịa mkpuru ìsì, n'enweghị ọmịiko.
Ekwere m na Chineke nke kere anyị, hụ anyị n’anya, nye onwe Ya maka anyị, ma na-adọta anyị n’akwụsịghị akwụsị, n’enweghị mgbagha, n’ịhụnanya, nye onwe Ya.
Ekwere m na ndụ nwere nzube.
Ekwere m na ọnwụ enweghị okwu nke ikpeazụ.
Ekwere m na ihe kachasi puta ìhè n'ezie. . . ọ jupụtara na ndụ, ịma mma, agba, na omimi.
Ekwere m na obi abụọ so n'ihe ndi anyi ji bụrụ mmadụ. Ọ na-agbatị anyị, na-emerụ anyị ahụ́, ma mgbe ahụ—ọ bụrụ na anyị ekwe ya—ọ ga-eduga anyị n’okwukwe miri emi.
Ekwere m na ọbụlagodi mgbe anyanwụ gbara ọchịchịrị, ọ ga-alaghachikwa ọzọ. Ọchịchịrị kpuchiri anyanwụ ga-agafe. Ụwa nwere ike ịdị iche, ma anyị onwe anyị dịkwa otú ahụ.
Ekwerekwara m na ọ nwere ihe ndị mezuru anyị karịa ihe ndi ana ahụ anya.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.
More