Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Atụ
N’Ọpụpụ, mgbe Chineke gwara Mọzis ka ọ yipụ akpụkpọ ụkwụ ya, ọ bụ n’ihi na ọ guzoro n’ala dị nsọ. Nke ahụ bụ ihe na-aghaghị itụ ya anya! Ọ maara ebe nke ọzara ahụ nke ọma. Ọ jeele ije n'elu ya ọgu arọ abụọ dika onye-ọzùzù-aturu. Ka Mọzis si chee, ọ bụ ebe ọ na-arụ ọrụ. N'uche ya, ọ bụ ebe n'enweghị ihe bara uru eji mara ya, di uzuzu uzuzu, nke ruru unyi, nke atụrụ zọkasiri ụkwụ. Mana Chineke sịrị na ọ dị nsọ.
Gịnị ka ị cheere ma ọ bụrụ na ala ị nọ na ya ugbu a jụrụ eju n'nso? Gịnị ka ị cheere ma ọ bụrụ na ihe niile gbasara ndụ gị jupụtara na onyinyo nke Chineke? Gịnị ka ị cheere ma ọ bụrụ na olu Ya nọ n'ime ikuku nke gbara gị gburugburu?
Chineke na-ekwu okwu. Ọ nwere ike ọ gaghị adị n'ụzọ ị si na-atụ anya.
• Ọ na-ekwu okwu site na ndị ọzọ. Ọbụna di ndị na-akpasu gị iwe.
• Ọ na-ekwu okwu site na ihe ndi edere ede, ndi a na-akpọ akpọ, ma ndi esere ese: ezigbo akwụkwọ ndi edere ede, egwu, okwu ọṅụ emere di ka abụ, abụ, na ihe ndi fọtọ.
• Ọ nwere ike ikwu okwu site na nrọ. . . .
• Ọ na-ekwu okwu site n'okike, ka anyị na-ekuba ka ume ịma mma nke ihe Ọ kere.
• Ọ na-ekwu okwu site na nkwenye na enweghi udo obi na ihe pụtara ka ọ dịghị nma. (Mgbe ụfọdụ ihe bụ isi okwu abụghị ịgbachi nkịtị nke Chineke kama ọ bụ ezigbo ụda nke mmehie na-eme. Mmehie chọrọ ịbụ olu kachasi daa ụda ná ndụ anyị. Ekwela ka ọ dị.)
• Ọ na-ekwu okwu site na ihe mgbu anyị.
• Ọ na-ekwu okwu n'ime mfu anyị.
• Ọ na-ekwu okwu ọbụna di n'ime obi abụọ anyị.
Ọ bụrụ na Chineke dị, ọ ga-apụta na ọ dịghị ihe dị ka ala nkịtị. Ala niile dị nsọ. Oge a, ugbu ugbu a, ebe ọ bụla ị nọ, dị nsọ. Chineke na-akpọ gị òkù ka ị yipụ akpụkpọ ụkwụ gị ma mikpunye mkpịsị ụkwụ gị ma fee ofufe.
Ọ nọ ebe a.
Mkpịsị aka nke Chineke zuru na ndụ gị niile.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.
More