Mgbe Okwukwe Dara Mba: Ụbọchị Iri Nke Ịchọta Chineke N'ime Onyinyo Nke Obi AbụọIhe Atụ
Obi nke Chineke bụ, ma bụrụkwa mgbe niile, ka ndị ụka biri ka ezi-na-ụlọ. Ụka bụ ebe anyị na-agba mgba, na-ahu ihe ndi n'eju anyi anya, na-efe ofufe, na-enwekọrita obi abụọ ọnụ. Nzukọ-nsọ bụ ebe anyị na-eji ihe ndi ngbapisi niile nke ndụ anyị gara aga wee bịa ma na-enweta ọgwụgwọ, nnabata na amara. Ụka bụ ebe ndị ndụ ha gbapisiri agbapisi na-achọpụta na ha anọghi naanị ha. Nke ahụ bụ ebumnuche Chineke mgbe mbụ Ọ wụsara ndi nzukọ-nsọ mmụọ Ya na Ọrụ Ndị Ozi 2. Nke ahụ bụkwa ebumnuche Chineke maka gị.
Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ụlọ ụka arụbeghị ọrụ bara uru ibi n'ime ebumnuche a. Ọ bụ eziokwu na enwere otutu ihe ndi kwesịrị ịgbanwe, mana ị nwere ike ịbụ mgbanwe ahụ.
Ị bụ nzukọ-nsọ.
Ụlọ ụka abụghị ụlọ ewuru ewu kama ọ bụ obodo nke ndị na-eso ụzọ Jizọs. Nke a pụtara ịdabere n'ihe niile dị mma, ihe niile mara mma na nke na-adịghị mma gbasara okwukwe anyị—na ibe anyị. Ọ pụtara ijigide onwe anyi aka na alụso obi abụọ anyị agha.
Na Matiu 26, obere awa tụpụ ọnwụ Ya, Jizọs na ndị enyi Ya nọdụrụ ala gburugburu tebụl. Ha bụrụ abụ. Ha kpere ekpere. Ọ weere otu ogbe achịcha wee nyawaa ya; Ọ weere otu iko mmanya wee kee ya. Ọ si, “Nke a bụ ahu M; nke a bụ ọbara M. Rie ma ṅụọ na ncheta M.” Ndị mmadụ dị iche iche nwere nnukwu nsogbu nọdụrụ ala n'okirikiri tebụl ahụ, ndi nwere obi abụọ, ndi nwere ihe ntụpọ di iche iche n'àgwà ha, ndi nwere igba mgba n'okwukwe ha.
Ma Jizọs nabatara ha niile. Ọ kesaara ha ahụ Ya gbajiri agbaji. Ọ nyere ha ebe nnodu na tebụl.
Olee ebe obodo ahụ dị maka gị? Olee ndị bụ ndị nọ na tebụl gị ị na-ekwe ka ha banye n'ebe ndị zoro ezo nke ndụ gị? Kedu ụzọ ị nwere ike isi kesaara ha mgbajisi gị?
Ịkwesighi ịtachi obi na-edi obi abụọ naani gi. . . .
Ọ bụrụ na gị na obi abụọ na-agba mgba, ị kwesịrị ịnọ n'ime obodo.
Ma nke a abụghị naanị n'ihi gị; ọ bụ maka ọdịmma ndị ọzọ. Ọbụrugodi na gị na obi abụọ anaghị agba mgba, ọ ga-abụ na ndị nọ gị nso nwere nsogbu a. ị di ha mkpa. Ha na-achọsi ekpere gị ike, ige ntị gi, na agbamume gị. Okwu ahụ bụ́ ịgba ume pụtara n’ụzọ nkịtị “inye obi ike.” Ị nwere ikike ịkenye onye na-ada mbà n'okwukwe ya obi ike. Otu n'ime ihe kacha enye ike ị nwere ike ịgwa enyi gị na-enwe obi abụọ bụ, "A ga m ahụgide gị n'anya n'ime nke a." I di ha mkpa. Ọnụnọ gị di ha mkpa. Ike gị di ha mkpa. Ọnya gị dikwa ha mkpa.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ịgba okwukwe na obi abụọ mgba nwere ike ịdị nnukwu nnoro onwe na enweghi mmadu. Ụfọdụ na-ata ahụhụ na agbachi nkịtị ebe ndị ọzọ na-ahapụ nkwenye kpamkpam, na-eche na obi abụọ na okwukwe adịghị nkwekọta. Dominic Done kwenyere na nke a bụ ma ihe jọgburu onwe ya nakwa nke a na aghọtaghi ofuma. Ọ na-eji Akwụkwọ Nsọ na akwụkwọ ndi edere ede na-arụ ụka na ọ bụghị nanị na ịjụ ajụjụ bụ ihe kwesịrị ekwesị kama ọ na-abụkarị ụzọ e si enweta okwukwe bara ụba na nke siri ike. Nyochaa okwukwe na obi abụọ n'ime atụmatụ ụbọchị iri a.
More