Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru OkèIhe Atụ
Igodo Nke Asaa: Rịọ Mmụọ Nsọ Maka Enyemaka
Akwụkwọ Nsọ na-agwa anyị na onye Nduzi ekwesịrị ịtụkwasị obi bụ naanị Mmụọ Nsọ. Ọ bụ Ya bụ Onye maara ihe gara aga gbasara anyị nke ọma, site n’oge a tụụrụ ime anyị ruo ugbu a, marakwa ọdịnihu anyị, site n’ụbọchị taa ruo mgbe ebighị ebi. Ọ maara atụmatụ na nzube Chineke maka anyị taa na ụbọchị ọ bụla nke ndụ anyị. Ọ makwaara ihe dị mma na ihe ziri ezi nye anyị.
Jizọs kwuru ugboro ugboro na Mmụọ Nsọ bụ “Mmụọ nke eziokwu.” Rịba ama ihe O kwuru banyere ọrụ Mmụọ Nsọ na-arụ ná ndụ gị: “Ọ ga-eduru gị baa n'ime eziokwu niile; n'ihi na Ọ gaghị-ekwu okwu n'onwe-Ya, ma ihe ọ bula Ọ nụrụ, ọ bụ ya ka Ọ ga-ekwu; Ọ ga-ekpughekwara gị ihe gaje ịbịa” (Jọn 16:13). Mmụọ nke eziokwu dịka ihe nduzi-ụzọ nke ime ná ndụ anyị, n'edú anyị mgbe niile ị bụ ihe Jizọs ga-abụ, kwuo ma ọ bụ mee n’oge ọ bụla.
Ihe niile Jizọs mere bụ ihe Nna kpugheere Ya. Anyị nwà, kwa, ga-arịọrịrị Mmụọ Nsọ ka O kpughee uche Nna nye anyị. Dịka ọmụmaatụ, onye n'adịghị arịa ọrịa nke mmetụta-uche nwere ike iwe iwe, ma site n'ịrịọ Mmụọ Nsọ maka nduzi maka otu esi eme ka iwe ahụ banye n'omume ziri ezi, onye ahụ ga-achọta ụzọ iji iwe ahụ mee ihe na-eweta ngọzi, a bụghị mmerụ ahụ. Onye nwere ahụike nke mmetụta-uche nwere ike inwe ndakpọ olileanya ma ọ bụ nkụda mmụọ, mana site n'ịrịọ Mmụọ Nsọ maka nduzi, a ga-eduga ya na ohere ọhụrụ nke na-ebute olileanya.
Cheta, a n'enye gị Mmụọ Nsọ mgbe i buuru obi gị tụkwasị ya na Kraịst. Ọrụ nke Mmụọ Nsọ bụ inye gị nduzi na ndụmọdụ kwa ụbọchị, inyere gị aka ije ije n’ụzọ nke Onye-nwe-anyị, na ime nhọrọ amamihe dị̀ na ya. Rịọ maka enyemaka nke Mmụọ Nsọ kwa ụbọchị. Rịọ Ya ka O chebe gị pụọ n'ihe ọjọọ na ka O duru gị baa n'ime ezi omume. Nye Ya ikike maka ihe niile i n'eme n'ụbọchị, mmekọrịta gị na ndị mmadụ kwa ụbọchị, na mmetụta niile ị na-enwe. Tụkwasa Ya obi inyere gị aka ịchụso ahụike mmetụta-uche na ume, n'eme ka ndụ mmetụta uche gị na nke ime mmụọ gị dakoó n'udo—ndụ zuru okè tọrọ ntọala na Jizọs Kraịst.
Chọpụta atụmatụ ihe ọgụgụ ndị ọzọ dị ka nke a na intouch.org/plans.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.
More