Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru OkèIhe Atụ

Seven Keys To Emotional Wholeness

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Igodo Nke Anọ: Kwụsị Ime Inye Chineke Ihe Ka Ị Nata Ihe N'aka Ya

O nwere ike ịbụ na ị na-eche na ọ bụrụ na ị na-agbasi mbọ ike ma na-eme ihe ọma na ndụ gị, Chineke ga-anabata gị. Ọ bụrụ otu ahụ, ị ​​n'eme iji ọrụ ọma gị inata nnabata nke Nna-Anyị-Chineke. Nke bụ eziokwu bụ na, Chineke nabatara gị dịka ị dị, ọ bụ gị na-enwe nsogbu ịnakwere ịhụnanya Ya.

O nwere ike ịna esiri gị ike ịnakwere ebere nke Chineke n'ihi na ị jibeghị obi gị niile nakwere ịhụnanya Ya. Ma ọ bụ na inye-na-inara, ị zụrụ-na-ire-ihe nke ụdị ndụ a n'ebị ugbu a amarala gị ahụ nke mere gị n'eche na ị nwere ike ịna emeso Chineke otu ahụ: Ị meeré m nke a, m ga-emere gị nke a. Chineke esighị otu ahụ arụ ọrụ ma ọ bụ nabata ụdị omume dị otu ahu.

Otu n'ime isi ihe nke ụzọ Ya bụ nnabata gị kpam kpam mgbe ị rịọrọ mgbaghara Ya ma mee uche Ya. Ọ bụrụ na Ọ chọrọ ịgbanwe ihe ọbụla na ndụ gị, ụzọ O si eme nke a bụ iji ndidi na obiọma (ihe si na ya agaghịkwanụ abụ nke i n'apụghị idì), ịhụnanya Ya na-adịgidekwa (ọ dịghị mgbe ọ na-akwụsị ma ọ bụ pụọ). Ị pụghị iji m meeré gị, gị e meere m wee gbanahụ uche Chineke, n'agbanyeghị otú ọbụla ị si nwaa ike gị.

Gịnị bụ ụzọ kwesịrị ekwesị isi meso Chineke omume karịa ime m meeré Chineke, Ya E meere m? Obi dị m ụtọ na ị jụrụ ajụjụ a! 

Tukwasí Chineke obi.

Rịọ Ya banyere ihe ị na-achọ, tụkwasị Ya obi ịza ekpere gị dịka amamihe Ya na ndokwa Ya n'enweghị ngwụcha siri dị. “Ya mere, unu echegbula onwe unu, sị, ‘Gịnị ka anyị ga-eri?’ ma ọ bụ ‘Gịnị ka anyị ga-aṅụ?’ ma ọ bụ ‘Gịnị ka anyị ga-eyì?’ … n’ihi na Nna unu nke eluigwe maara na ihe ndị a nile dị unu mkpa. Ma burunù ụzọ chọọ ala-eze-Ya na ezi omume-Ya, a ga-atukwasi-kwa-ra unu ihe ndị a nile” (Mt 6:31-33).

Okwu Chukwu

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Seven Keys To Emotional Wholeness

Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele In Touch Ministries maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.intouch.org/reading-plans