Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru OkèIhe Atụ
Igodo Nke Isii: Kwụsị Ịdebe Obi Gị Na Ọdịda Gị Ndị Gara Aga
Mmeri bụ uche Chineke maka ndụ ndị kwere na Ya. Mana mgbe ụfọdụ ka anyị na-ahụ onye anyị n'adaba ugboro ugboro n'ime njọ ndị ahụ anyị chọrọ ịkwụsị. N’ihi ya, ndụ anyị bụ nke na-ejupụta na ikwe nkwa ịkwụsị njọ nke anyị na-adịghị emezu emezu. Anyị na-agwa Onye-nwe-anyị na ọ bụ agụụ nke obi anyị ime ihe ziri ezi, ma ọtụtụ mgbe ka ọchịchọ anyị a na-ebelata mgbe ime ihe ziri ezi n'esi ike, adịghịzi enye obi ụtọ, ma ọ bụ na anyị adịghịzi enweta uru na ya. Ọtụtụ oge, ndị kwere ekwe na-eweso Chineke iwe maka na Ọ nyeghị ha mmeri ahụ ha chọsiri ike, mana ime mmehie ma ọ bụ emeghị mmehie bụ nhọrọ dịịrị anyị mgbe niile — nke ahụ abụghị ihe Chineke n'amanye anyị ka anyị mee.
Mgbe anyị ji obi anyị niile chegharia na mmehie anyị, rịọ Onye-nwe anyị mgbaghara Ya, ma tụkwasị Kraịst dị ndụ obi inye anyị ike, anyị na-emepụta ike kwụ chịm imegide ekwensu na ọnwụnwa. Anyị na-emeri ọdịda anyị mgbe anyị chetara na Jizọs Kraịst bụ isi iyi nke ndụ anyị, Chineke ana-emesikwa anyị obi ike na mmeri ga-abụ nke anyị mgbe anyị dabere na Ya.
Otu akụkụ nke inweta mgbaghara nke Chineke na ibi ndụ mmeri bụkwa ịgbaghara onwe gị. Ozugbo Chineke gbaghaara gị, mmehie gị niile i meworo abụghịzi ndị i kwesịrị ịna echeta na ọ bụ n'ekwu maka ha, ma ọdịda gị, ma adịghị ike gị niile. Ị bụ onye e kere ọhụrụ n'ime Kraịst Jizọs (2 Ndị Kọrint 5:17). Oge ọ bụla ị na-edebe obi gị na ọdịda gị ndị gara aga, ị na-emechi obi gị na uche gị nye ngọzi ndị Chineke kwadebere maka gị. Kama debe uche gị na ọtụtụ ụzọ Nna-Anyị-Chineke siworo nyere gị aka ná gọzie gị n'ime ndụ gị. Oge ọ bụla ị na-ahụ onwe gị na-atụgharị uche na ọdịda gị ndị gara aga, chetara onwe gị na Chineke esila na mmehie gbapụta gị. Mgbe ị mechara nke a, buru uche gị debe n'ihe ọma ndị O mewooro gị, n'ime gị, na site n'aka gị. Malite ito Ya n'ihi ịdị mma Ya, na-akwụsịkwa ichè maka mmehie ndị ahụ jideburu gị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.
More