Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru OkèIhe Atụ

Seven Keys To Emotional Wholeness

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Igodo Nke Mbụ: Nye Kraịst Obi Gị

Mgbapụta nke ime mmụọ bụ mkpịsị-igodo mbụ n'ịzụlite ụzọ dị mma mmadụ si ahuta onwe ya. Ndị na-amaghị Kraịst nwere ike ịna asị na ka ha si ahuta onwe ha juru ha afọ, ma ha agaghị ekwu otu ahụ ma ọ bụrụ na ha na-agwa onwe ha eziokwu. Ọtụtụ ndị na-ekweghị na Jizọs bụ́ ndị na-ekwupụta na onwe ha zuuru ha, na ọ dịghị mkpa ka ha nweta Kraịst, bụ ndị n'enwe ezigbo nhụsianya n'oge ọgbaghara. Ha dị ka akwụkwọ ahịhịa mara mma n'enweghị mgbọrọgwụ siri ike. Ha nwere naanị onwe ha ịdabere nà iji nweta ike, ume, ịnụ ọkụ n'obi, na imepụta ihe. N'ikpeazụ, ike onwe ha na-agwụ ha. Ha enweghị Mmụọ Nsọ n’ime ha iji wulite ha n’ime Kraịst n’ụzọ nke na-akasi obi ma dabere n’eziokwu, ọbụna n’oge ntaramahụhụ ihe nke ụwa a. 

Gị na Jizọs Kraịst inwe mmekọrịta na-edozi ọtụtụ esemokwu na-emebi ịdị mma nke mmetụta uche:

· Obi amam ikpe. Amam ikpe n'amipụta mgbe ị ka nwere njọ ịna arịọbeghị Chineke mgbaghara maka ya. Mgbe ị rịọrọ Chineke mgbaghara, Ọ ga-agbaghara gị. Amam ikpe gị ewee bụrụ nke asachapụrụ (Ndị Rom. 8:1).

· Mmetụta nke na-ahụghị́ gị na-anya. Mgbe i gbakwutere Kraịst, ị ga-anabatarịrị na Chineke hụrụ gị n'anya ma chọọ ka gị na Ya nwee mmekọrịta nke ebighị-ebi (Ndị Rom 8:38-39).

· Inwe mmụọ nke imegwara ndị ọzọ. Ozugbo ị natara onyinye nzọpụta nke Chineke dị efu, ị kwesịrị ịghọta na Chineke chọkwara ịgbaghara ndị ọzọ. Ihe Chineke meere gị, ka Ọ chọkwara imere mmadụ nile, n'agbanyeghị ihe ha mere n'oge gara aga (Ndị Kọlọsi. 3:13).

· Ịgbalịsi ike inweta ihu ọma na-aka Chineke. Onyinye nzọpụta nke Chineke nyere gị dị efu. Ị pụghị inweta ya n'onwe gị, zụta ya, ma ọ bụ nweta ya site n'ọrụ ọma gị. I rughị eru inweta ya ma ọlị. Mgbe a mụrụ gị ọzọ n'ime mmụọ, ị kwesịrị ịnabata na ihu ọma ọ bụla i nwere n'ebe Chineke nọ dabeere n'ihe Kraịst meworo (Efe 2:8-9).

Ọ bụrụ na ị chọrọ izu oke na mmetụta uche gị ụbọchị taa, were ndụ gị nye Kraịst. Ozugbo ị nabatara Kraịst Jizọs dị ka Onye Nzọpụta nke onwe gị, ị ga-esorịrị Ya dịka Onye-nwe-gị. Iso Kraịst n'ụzọ dị otú a kwa ụbọchị gụnyere ikwupụta mmehie gị, ịsachapụ mmụọ gị kwa ụbọchị nke dị oke mkpa maka ahụike ime mmụọ gị dịka ịsa ahụ kwa ụbọchị bụ maka ahụike anụ ahụ gị. Ị ga-achọ mgbaghara Chineke nke mbụ maka ọdịdị gị bụ sọ mmehie na maka mmehie ndị ị na-eme ka ị na-eso Kraịst.

Cheta, ọ dịghị onye pụrụ iso Kraịst n'ụzọ zuru oke. Onye ọ bụla n'ada mbà kwa mgbe kwa mgbe n'ihi mmejọ ama ama mee na nke a n'amaghị ama mee—ihe ụfọdụ ndị mmadụ na-akpọ nmehie akpacha anya mee na ndị a n'akpachaghị anya wee mee. Ọ bụ maka mmehie ndị a ka ị ga n'achọ mgbaghara Chineke akwụsịghị akwụsị. Ma mgbe ị n'aga n'ihu n'achọ mgbaghara Ya, Nna gị nke eluigwe hụrụ gị n'anya kwere nkwa inye gị amara na ebere Ya (Ndị Efesọs. 1:7).

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Seven Keys To Emotional Wholeness

Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele In Touch Ministries maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.intouch.org/reading-plans