Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru OkèIhe Atụ

Seven Keys To Emotional Wholeness

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Igodo Nke Abụọ: Jiri Akwụkwọ Nsọ Mejupụta Onwe Gị

Mgbe a gbaghaara gị, ị nweghịzi ntụpọ n'ihu Chineke. Ma o zughị ezu naanị ịdị enweghị ntụpọ. Ị ga-arịọrịrị Onye-nwe-anyị ka O dee eziokwu Ya n'ime nke obi gị. Ọ dị mkpa ka a kunye ịdị mma Chineke n'ime gị. Ị na-enweta eziokwu Chineke banyere ọnọdụ niile site n'ịgụ Okwu Ya. Ịkwesịrị iji echiche nke Chineke mejupụta onwe gị, ma n'akụkụ ahụike nke mmetụta uche, nke ahụ pụtara iji echiche nke Chineke banyere gị mejupụta onwe gị.

N'ime Akwụkwọ Nsọ, ị ga-achọpụta na ị bụ:

· Nwa Chineke. Ndị Galeshia 3:26-27 na-ekwu, sị: “N’ihi na unu niile bụ ụmụ Chineke site n’okwukwe na Kraịst Jizọs. N’ihi na unu niile bụ́ ndị e mere baptizịm baa na Kraịst eyikwasịwo onwe-unu Kraịst.” Ma 1 Jọn 5:1 na-emesikwa obi ike si na “onye ọ bụla nke kwere na Jizọs bụ Kraịst ahụ, bụ onye a mụrụ site na Chineke, ma onye ọ bụla nke hụrụ Nna-Anyị-Chineke n’anya hụkwara n'anya nwa a mụrụ site na Ya.”

· Onye Chineke jiri obi Ya niile nabata kpamkpam na n'ụzọ zuru ezu. Ịghọta na dịka nwa Chineke, na Chineke nabatara gị kpam kpam na n'ụzọ zuru ezu bụ isi ihe banyere ahụike mmetụta uche gị. Ọrụ Ndịozi 10:34-35 na-akụziri anyị na “Chineke abụghị onye na-ele mmadụ anya n’ihu, kama ná mba ọ bụla, onye na-atụ egwu Ya ma na-eme ezi omume bụ onye Ọ na-anabata.”

· Onye-nketa nke Nna site na Kraịst Jizọs. Na ngwụcha, ịmará na Okwu Chineke na-ekwe nkwa na dị ka nwa Ya, ị bụ onye-nketa Ya site n’aka Jizọs Kraịst na-edozi uche gị ma hụ na ị ga-aga n’ụzọ ziri ezi n’ihe gbasara ahụike na ọdịmma mmetụta uche gị. Ndị Galeshia 3:29 na Taịtọs 3:7 na-ekwe nkwa na ọ bụrụ na anyị bụ nke Kraịst, yabụ na anyị bụ ụmụ Ebraham; ndị-nketa dịka nkwa ahu si dị; na, ndị a gụrụ ndị ezi omume site n’amara Ya, e mere ka ha bụrụ ndị nketa dịka olileanya nke ndụ ebighị-ebi siri dị. 

E nwere ọtụtụ nkọwa ndị ọzọ nke ndị Chineke pụtara n’Akwụkwọ Nsọ. Tụgharịa uche n'Okwu Ya, na-arịọ Ya ka O mee ka echiche Ya dị ebube pụta ìhè nye gị. Depụta echiche Ya ndị ahụ ma ọ bụ jiri pensụl gbaa gburugburu ka ị na-agụ Akwụkwọ Nsọ gị kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na a mụọla gị ọzọ site na Kraịst Jizọs, nkọwa ndị a niile gbasara ụmụ Chineke metụtara gị… were ha dịka akụkụ nke njirimara gị.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Seven Keys To Emotional Wholeness

Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele In Touch Ministries maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.intouch.org/reading-plans