Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru OkèIhe Atụ

Seven Keys To Emotional Wholeness

ỤBỌCHỊ 5 NKE 7

Igodo Nke Ise: Nye Ndị Mmadụ Ihe Ọma Si Na Gị

Oké nleba anya n'ime nsogbu gị na adịghị ike gị gasị nwere ike ime ka i bụrụ mmadụ na-apụghị inye mmadụ ibe gị ihe ụtọ ọbụla. Ọ bụrụ na i nwetụbela ají ahụ gị ma ọ bụ mbó ụkwụ gị tobarà ime, ị ga-amanú otu obere ihe nke ahụ gị pụrụ inye ezigbo ufu na nsogbu. Otu a ka ọ dịkwa nye ndụ nke ime mmụọ gị na nke mmetụta uche gị. Ị nwere ike ghọọ onye ya na mmadụ ibe ya n'adịghị enwe mmekọrịta nke ga-emeru gị nnukwu ahụ ka oge n'aga, n'ihi na i chọrọ ima onwe gị ma ọ bụ jiri aka gị dozie nsogbu gị. 

Ngwọta kachasị mma maka ọtụtụ ihe isi ike nke mmetụta uche bụ ikwe onwe gị ka i pụta n'ebe izoro wee malite n'enyere mmadụ ibe gị aka. Ị nwere ike ịsị, "Mana ọ dịghị ihe m nwere m ga-enye." Onye ọ bụla nwere ihe ọ pụrụ inye, ọ bụrụgodị na ọ bụ naanị ịmụmụ ọnụ ọchị, okwu ọma, ma ọ bụ nwa aka e mesara n’ubu n’oge mkpa. Mgbe ụfọdụ, naanị ọnụnọ gị nwere ike ịbụ onyinye nye mmadụ, ọkachasị ndị n'enweghị mmadụ, ndị na-eru uju, ma ọ bụ ndị ọrịa na-ekweghị ịhapụ aka. Ndị kasị nwee obi ụtọ m maara bụ ndị obi ha dị mmesapụ-aka nye mmadụ ibe ha na ndị n'enye mmadụ ihe n'enweghị ntamụ̀. Ndị dị otú ahụ dị oké nchebe n’ịhụnanya Chineke. Nye ihe n'atụghị anya na-ịga anata ihe ọ bụla n'aka onye i nyere ihe. Chineke ga-ahụ obi gị na ihe ị na-eme ... Ọ ga-akwụkwa gị ụgwọ obi ọma gị. Tụkwasa Ya obi ilekọta gị.

Site n'inye ihe sí ka a ghara ikwu gị ụgwọ na ịdị mmesapụ-aka, ị na-emeghe ndụ gị inata ihe ọma. Idi otu ahụ n'ihu Chineke na imeso mmadụ ibe gị otu ahụ dị mkpa maka ahụike nke mmetụta uche. Ọ bụ naanị site n'idi otu ahụ ka ị ga-amụta ịtụkwasị Chineke obi, ma ụdị ntụkwasị obi a dị ezigbo mkpa ka i nwee ike inata mgbaghara na ọgwụgwọ Chineke, na ikwere na Chineke ga-egboro gị mkpa gị niile.

“Na-agwọnụ ndị ọrịa, kpọlitenụ ​​ndị nwụrụ anwụ, sachapụnụ ndị ekpenta, chụpụnụ ndị mmụọ ọjọọ. Unu natara ihe n'akwughị ụgwọ, n'enyenụ̀ ihe atụghị anya nnataghachi” (Matiu 10:8). 

Okwu Chukwu

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Seven Keys To Emotional Wholeness

Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele In Touch Ministries maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.intouch.org/reading-plans