Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Igodo Asaa Iji Nweta Mmetụta Uche Zuru OkèIhe Atụ

Seven Keys To Emotional Wholeness

ỤBỌCHỊ 3 NKE 7

Igodo Nke Atọ: Nata Ọgwụgwọ Chineke Maka Mmejọ-Gị Gasị

Mmadụ niile nwere ihe gbasara onwe ha, ha na-ahụghị n'anya. Onye ọ bụla n’ime anyị na-emekarị ilekwasị anya n’ihe ndị dị njọ banyere anyị na esighi-ike anyị gasị karịa ilekwasị anya na ihe ndị anyị dị nma na ya. Nke ahụ bụ nnọọ ọdịdị mmadụ. Otú ọ dị, e nwere ụfọdụ ihe na ndụ, a na-apụghị ịgbanwe agbanwe. Dịka ọmụmaatụ, ị pụghị ịgbanwe ezinụlọ isi wee pụta, ị pụghịkwa ịgbanwe agbụrụ gị ma ọ bụ ọdịdị ahụ́ gị. Ụfọdụ adịghị ike anụ ahụ na/ma ọ bụ nkwarụ apụghị ịdị mgbanwe. Ma mgbe ị na-eche ihe ndị a na-adịghị agbanwe agbanwe ihu banyere gị nke na-eme ka ị dị ebube na dị ọpụrụ-ịche, ọ ga-abụ amamihe nye gị ịnakwere na site n'amamihe Chineke dị oké omimi, ọ bụ ụzọ kacha nma O si wee kee gị.

Ụfọdụ ihe na ndụ apụghị ịgbanwe agbanwe n'ihi ụwa nke i bi n'ime ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị gaghị enwe ike ịgbanwe eziokwu ahụ bụ́ na ndị mụrụ gị agbaala onye ha alụkwaghịm ma ọ bụkwanụ na ụmụ gị na-etinye aka n’ọnọdụ ndị dị ize ndụ ma ọ bụ àgwà ndị na-emebi ihe. Mana ị nwere ike ikpe ekpere ka Onye-nwe-anyị weta ọgwụgwọ n’ime gị na n'ime ndị ị hụrụ n’anya.

Otú ọ dị, e nwere ụfọdụ ihe gbasara gị, àgwà gị, na mmetụta-uche gị nke a pụrụ ịgbanwe. Dịka ọmụmaatụ, ị nwere ike ichè na ịkwo ekworò ma ọ bụ ina ewekarị iwe bụ otu ọdịdị gị dị. Mana ka m gwa gị eziokwu, anyaụfụ na iwe iwe bụ àgwà ị sị n'ezi nweta. Ị nwere ike ịrịọ Onye-nwe-anyị ka Ọ gwọọ gị ekworo na iwe gị ma nyere gị aka ịtụkwasị Ya obi na kwụsị ile ndị ọzọ anya ọjọọ.

Yabụ, kedụ ka ị ga-esi nweta ọgwụgwọ na mmetụta uche gị? Nke mbụ, ị ga-achọpụta àgwà nke ị ma na ọ dịghị Onye-nwe-anyị mma n'obi ma rịọ Ya ka Ọ gbaghara gị maka ikwe ka àgwà ahụ too n'ime gị. Nke abụọ, rịọ Ya ka Ọ gwọọ gị omume a. Nke atọ, nye Ya ikike ime ihe ọ bụla Ọ chọrọ ime na ndụ gị iji mee ka ị dị mma na zuo okè. Nke ikpeazụ, nwee okwukwe na Chineke na-arụ ọrụ na ndụ gị nakwa na Ọ ga-eme ka ị zuo oke n'oge Ya na dịka usoro Ya siri dị.

Chineke na-eme ebere. Ọ na-agbaghara, Ọ na-enye ngwọta, O kwekwara nkwa ịbanye n'akụkụ ọ bụla nke ndụ gị ịna-emeghere Ya. “Ugbu a ka Chineke nke udo n'Onwe Ya doó unu nsọ n'ụzọ zuru okè; ka mmụọ-unu, mkpụrụ-obi-unu, na ahụ-unu-dum dị ndebe n'ụzọ n'enweghị ntụpọ n'ọbibia nke Onye-nwe-anyị Jizọs Kraịst. Onye na-akpọ unu kwesịrị ntụkwasị obi, ọ bụ Ya ga-emekwa ya” (1 Ndị Tesalonaịka. 5:23-24).

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Seven Keys To Emotional Wholeness

Enwere ma ọ dịkarịa-ala akụkụ asaa bụ isi nke izu-oke n'ịchọ ihe nke Chineke kacha mma maka ọdị nma ndụ mmetụta uche gị. Ọ dịghị mkpa ka iwere ha n'usoro n'usoro. Soro Dr. Charles Stanley ka ọ na-enyere gị aka iwulite àgwà ndị bụ isi n'ime ndụ gị nke ga-enyere gị aka itozu-oke na mmụọ na mmetụta-uche gị. Chọpụta atụmatụ ọgụgụ dị ka nke a na intouch.org/plans.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele In Touch Ministries maka ịnye atụmatụ ihe ọgụgụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.intouch.org/reading-plans