Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị KraịstIhe Atụ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Eziokwu

Oziọma anọ ahụ niile dekọrọ akụkọ banyere oké ọdịda Pita n’ụzọ dị nkenke ma doo anya, di ka etu Matiu si kọọ akụkọ ahụ.

Ahụrụ m ọdịda Pita dara n’amaokwu a dị ka ihe e nwere ike ịghọta nke ọma n’ihi na enweghị m ike ikwu na m gaara eguzosi ike mgbe Pita emeghị etu ahụ.

Anyị maara site n’akụkọ oziọma na, naanị n’awa ole na ole gara aga, Pita gbalịrị igbochi njide Kraịst n’ime ogige Getsemane site n’iji mma-agha bepụ ntị ohu onye isi nchụàjà. Ma, n’ebe a, n’amaokwu a, ụjọ tụrụ Pita n’ihu otu nwa agbọghọ na-eje ozi n’ogige nnukwu onye nchụàjà.

Pita, nwoke ahụ ọ bụ na naanị awa ole na ole gara aga, nwere obi ike na ezi ebumnobi, jupụtazirị ugbu a n’ihere, obi ilu, obi nkoropụ, na anya mmiri. Pita, nwoke ahụ ṅụrụ iyi na ya ga-anwụrụ Jizọs, na-aṅụzi iyi ugbu a ugboro atọ, n’udi na-adasi ike, na ya amaghịdị Jizọs. Na nkenke, Pita dara ada, ọ dakwara nke ukwuu.

Mà akụkọ banyere ọdịda Pita abụghị ihe pụrụ iche n’Akwukwo Nsọ. Akwụkwọ Nsọ dum, site na mmalite ruo ọgwụgwụ, bụ akụkọ nke gosiri ọdịda mmadụ n’ezie.

Adam na Iv dara, n’agbanyeghị na ha biri n’ụwa zuru okè. Abraham dara; ọ sịrị asị banyere nwunye ya. Mozis, bụ nwoke Chineke ji napụta ụmụ Izrel n’Ijipt, abanyeghị n’ala Nkwa ahụ.

Devid, onye mere obi Chineke, dara nke ukwuu: ya na Batsheba kwara iko, ọ ma gbuo di ya. Solomọn, nwa Devid dara, site n’iwebata ikpere arụsị n’Izrel. N’ime Testamentị àgbà Ochie niile, ndị nke Chineke dara site n’ọgbọ ruo n’ọgbọ, site n’ikpere arụsị kwa mgbe kwa mgbe nakwa na nnupụisi nye Chineke.

Testamentị àgbà ọhụrụ dekọkwara akụkọ gbasara ndị Chineke na-ada àdà. Ọ̀bụna n’akụkọ ngọnarị Pita a, Matiu na-agwa anyị na ndị na-eso ụzọ Ya niile ṅụrụ iyi na ha agaghị agọnarị Jisọs, ma n’oge awa nke Ọ nọ n’oke mkpa, ndị na-eso ụzọ ya niile hapụrụ Kraịst gbalaga. Ha niile dara.

Ekwenyere m na otu n’ime ihe mere eji dee akụkọ banyere ọdịda Pita n’Oziọma anọ ahụ bụ na ọ kpọrọ anyị, dị ka Ndị Kraịst, ịkweta n’eziokwu na anyị dara. Pita, otu n’ime ndị na-eso ụzọ Kraịst, dara ada. Ana m ada. Ị dara. Anyị niile na-ada n’otu ụzọ maọbụ n’ụzọ ọzọ, ma n’ime otú ahụ, anyị onwe anyị na-agọnarị Onyenwe anyị.

Na nchịkọta, ọdịda bụ eziokwu na ndụ Ndị Kraịst nke anyị ga-eme nke ọma ịkwere na ịhụ n’ụzọ eziokwu etu Akwụkwọ Nsọ si anabata ma na-ahụ ya.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

Atụmatụ ịhe ọgụgụ ụbọchị ise a, nke na-agba ume na-enyocha eziokwu ahụ na, site n’ọbụbụeze Ya, Chineke na-ahụ ọdịda anyị n’ihu, ma n’obiọma ya, Ọ na-agbaghara ọdịda anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Returning to the Gospel - West Africa maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://returningtothegospel.com/