Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị KraịstIhe Atụ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

ỤBỌCHỊ 3 NKE 5

Ihe Amaburu

Matiu kọrọ na Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya na otu n’ime ha nke ga-arara ya nye. O juru ha anya ịnụ nke a. Ha zaghachiri site n’ịsị, ‘Ọ pụghị ịbụ m! Ụzọ adịghị! Ọ bụghị m!'

Ọzọkwa, Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: ‘N’abalị a unu niile ga-adapụ n’ihi M.’ Ọzọ, ha niile zara, sị: ‘Mba, ee e, ee e! N’ezie, anyị agaghị eme ya!’ N’oge ahụ, ọ dịghị onye n’ime ha chere na ọ ga-abụ Judas. Pita zara sị, ‘Mmụ? Ọ gaghị eme! Agaghị m agọnahụ gị, ọbụlagodi na ndị ọzọ mee etu ahu! Ị maara m, Onyenwe anyị! Adị m njikere ịnwụ maka Gị!’ ma Jizọs zara site n’ibu amụma na tupu oké ọkpa akwaa n’echi ya, Pita ga-agọnahụ ya ugboro atọ.

N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, Onyenwe anyị buuru ụzọ hụ ọdịda Judas na Pita na ndị ọzọ na-eso ụzọ ya. N’ụzọ dị n’itụnanya, Jọn dekọrọ na mgbe Kraịst gwasịrị Pita na Pita ga-arara ya nye, ọ gara n’ihu ozugbo ịkasi Pita na ndị na-eso ụzọ Ya ndị ọzọ obi, na-asị, ‘Ka obi ghara ịlọ unu mmiri. Tukwasị Chineke obi, tụkwasịkwa m obi.’

Okwu ndị ahụ bụ ihe ịtụnanya n’ezie n’ihi na Kraịst maara na mbụ na ha niile ga-agbahapụ Ya n'oge na-adịghị anya. Mgbe Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya okwu ndị a, ihe Ọ na-agwa ha n’ezie bụ nke a:

“Amaara m nke ọma na otu onye n’ime unu ga-arara m nye, na otu onye n’ime unu ga-agọnarị m, na unu niile ga-agbahapụkwa m. Ma otu ihe ahụ, ana m aga n’obe ịnwụ n’ihi unu, ka obi ghara ịlọ unu mmiri.’

Nke ahụ ọ́ bụghị nnọọ ihe ịtụnanya?

Na nchịkọta, ekele dịrị Chineke! Ọdịda anyị niile dị ka Ndị Kraịst bụ nke Chineke buuru ụzọ hụ ma buru ụzọ mata ya, onye hụrụ anyị n’anya n’agbanyeghị ihe ndịa.

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

Atụmatụ ịhe ọgụgụ ụbọchị ise a, nke na-agba ume na-enyocha eziokwu ahụ na, site n’ọbụbụeze Ya, Chineke na-ahụ ọdịda anyị n’ihu, ma n’obiọma ya, Ọ na-agbaghara ọdịda anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Returning to the Gospel - West Africa maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://returningtothegospel.com/