Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị KraịstIhe Atụ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Agbagharala

Luk dere na, obere oge tupu Kraịst adọọ Pita aka ná ntị na ọ ga-agọnahụ ya ugboro atọ, Kraịst gwara Pita, sị: ‘Saịmọn, Saịmọn, Setan arịọwo ka ọ yọchaa unu niile dị ka ọka wit. Ma ekpewo m ekpere maka gị, ka okwukwe gị wee ghara ịda. Ma mgbe unu laghachiri, mee ka ụmụnna unu dị ike.’ Pita gara n’ihu, dị ka anyị hụworo, ịgọnarị Kraịst. Obi ike Pita dara, ma okwukwe Pita, adịghị dị ka okwukwe Judas si daa.

Na ngwụcha nke Oziọma Jọn, Kraịst ahụ bilitere n’ọnwụ si ebe a na-amaghi pụta na nso ọdọ mmiri Galili, were ọrụ ebube kwere ka ndị na-eso ụzọ ya gbute ọtụtụ azụ̀, o wee meere ha nri ụtụtụ n’ụ̀só osimiri.

Mgbe ha niile richara nri, ka ha sì n’ọdọ mmiri ahụ na-apụ, Kraịst jụrụ Pita ajụjụ a, sị: ‘Pita, ị̀ hụrụ m n’anya?’ Kraịst jụrụ Pita ajụjụ a ugboro atọ, dị nnọọ ka ugboro atọ ahụ Pita gọnahụrụ ya Ya.

Ekwere m na Kraịst mere nke a iji gosi Pita na okwukwe Pita kwere na Kraịst, na nzọpụta ya, adaghị ada, n’agbanyeghị na Pita etufuola nkwuwa okwu ya n’ogige onye isi nchụàjà. Nke a bụ Kraịst ahụ bilitere n’ọnwụ, onye nwuwororịị n’obe, na onye ​bukwasịworo onwe ya ikpe ọmụma niile, ọdịda, ihere, mmechuihu, na mmehie niile nke Pita.

Biko rịba ama etu Kraịst ahụ bilitere n’ọnwụ esighi baara Pita mba ma sị ya: ‘Echere m na ị sịrị na ị gaghị arara m nye?’ Nke a bụ ihe mụ na gị kaara ime, ọ bụghị ya? N’ihi na Kraịst abaraghị Pita mba, O gosipụtara eziokwu nke oziọma Jọn na-akọwa: Chineke eziteghi Ọkpara Ya n’ụwa ka O kpee ụwa ikpe, kamà ka O site n’aka Ya zọpụta ụwa. Kraịst abaraghị Pita mba n’ihi na ọ bịaghị ikpe Pita ikpe, kama ọ bịara ị zọpụta ya.

Ụmụnne m ndị m hụrụ n’anya, n’elu obe, Kraịst buru ọdịda anyị niile na ikpe ọmụma anyị na ihere anyị. Mgbe anyị tụkwasịrị okwukwe anyị n’ihe Kraịst meere anyị n’obe, Chineke na-agbaghara anyị mmehie anyị niile, Mmụọ Nsọ ya birikwa n’ime anyị, na-enye anyị ndụ nke Kraịst ahụ bilitere n’ọnwụ ma na-enye anyị ike ịjụ mmehie.

Kraịst anwụọlarị maka mmehie ọbụla anyị meworo maọbụ nke anyị ka ga-eme. Mgbe Mụọ Nsọ na-akpatụ anyị aka ichetara anyị na anyị emehiewo, anyị kwesịrị ịkwere mmehie ahụ, na ịkwere site n’okwukwe mgbaghara nke anyị dị n’ime Kraịst. Ọ bụ ya mere Pọl ji echetara anyị na otu n’ime nkwa dị ebube nke ozi ọma bụ na Chineke ji anya ya meghere emeghe zọpụta anyị n’ihi na Chineke maara ihe kacha njọ banyere anyị, tupu mgbe ahụ na mgbe nzọpụta anyị gasịrị, mkpebi ya ịzọpụta anyị n’ime Kraịst bụ mkpebi ikpeazụ nke ọ dịghị onye nwere ike ịgbanwe!

Na nchịkọta, Chineke, onye maara eziokwu nke ọdịda anyị, na onye mara ọdịda anyị tipu o mee, n'ime na site na Kraịst na oziọma, na-agbagharakwa ọdịda anyị nke ọma.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

Atụmatụ ịhe ọgụgụ ụbọchị ise a, nke na-agba ume na-enyocha eziokwu ahụ na, site n’ọbụbụeze Ya, Chineke na-ahụ ọdịda anyị n’ihu, ma n’obiọma ya, Ọ na-agbaghara ọdịda anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Returning to the Gospel - West Africa maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://returningtothegospel.com/