Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị KraịstIhe Atụ

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

ỤBỌCHỊ 1 NKE 5

Ngọnarị Pita Gọnarịrị Onyenwe anyị

Akụkọ Ista nke a na-elegharakarịsị anya nke ukwuu bụ akụkọ banyere ngọnarị Pita onyeozi gọnarịrị Onyenwe anyị. Akụkọ Ista a nke Pita nọ daa dị̀ ezigbo mkpa n’ihi na ọ bụ otu n’ime ihe omume Ista ole na ole e dekọrọ n’Oziọma anọ nke Àgbà Ọhụrụ.

Ọ dị m ka akụkọ a dị ịrịba ama n’ihi na ọ na-egosi anyị echiche oziọma banyere ọdịda anyị dị ka Ndị Kraịst. Nke mbụ, akụkọ a na-akụziri anyị na Chineke maara eziokwu nke ọdịda anyị dị ka Ndị Kraịst. Nke abụọ, akụkọ a na-akụziri anyị na Chineke buru ụzọ hụ ọdịda anyị dị ka Ndị Kraịst. Nke atọ, bụ nke kachasị mkpa, akụkọ a na-akụziri anyị na Chineke na-agbaghara anyị ọdịda anyị dị ka Ndị Kraịst.

Site n’atụmatụ ihe ọgụgụ ụbọchị ise a, anyị ga-esi n’ụzọ oziọma lebaa anya n’ihe gbasara akụkụ nke ọbụla nke ọdịda anyị dị ka Ndị Kraịst. Nke a ga-agba anyị ume nke ukwuu mgbe anyị na Chineke na-eje ije, anyị wee daa mba n’ịbụ ihe anyị maara na Chineke chọrọ ka anyị bụrụ, maọbụ daa mbà n’ịbụ ihe niile anyị chọrọ ịbụ n’onwe anyị.

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Ọdịda Anyị dị ka Ndị Kraịst

Atụmatụ ịhe ọgụgụ ụbọchị ise a, nke na-agba ume na-enyocha eziokwu ahụ na, site n’ọbụbụeze Ya, Chineke na-ahụ ọdịda anyị n’ihu, ma n’obiọma ya, Ọ na-agbaghara ọdịda anyị.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Returning to the Gospel - West Africa maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://returningtothegospel.com/