Mb͕e Pita nọ n'okpuru n'obí, otù nime umu-ab͕oghọ ndi nējere onye-isi-nchu-àjà ozi we bia: mb͕e ọ huru Pita ka ọ nānya ọku, o we le ya anya, si, Gi onwe-gi na Onye Nazaret ahu, bú Jisus, nọ-kwa-ra. Ma ọ gọrọ, si, Amataghm, aghọtaghm kwa ihe gi onwe-gi nēkwu: o we pua je n'uzọ-nbata. Nwa-ab͕ọghọ ahu we hu ya, malite kwa ọzọ isi ndi guzoro nso, Nwoke a bu otù onye nime ha. Ma ọ gọ-kwa-ra ọzọ. Mb͕e nwa oge gasiri ndi guzoro nso we si kwa Pita ọzọ, N'ezie i bu otù onye nime ha; n'ihi na i bu kwa onye Galili. Ma ọ malitere idu ikwù, na iṅu iyí, si, Amataghm Nwoke a Onye unu nēkwu. Ngwa ngwa oke-ọkuku we kwa ákwá nke ub͕ò abua. Pita we cheta okwu ahu, otú Jisus siri ya, Mb͕e oke-ọkuku akākwaghi ub͕ò abua, i gāgọnarim ub͕ò atọ. Mb͕e ọ tulere okwu a n'obì o we kwa ákwá.
Gụọ MAK 14
Geere nke a ntị MAK 14
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: MAK 14:66-72
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị