Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!Ihe Atụ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

“Ntụle Mmechi”

Ọ bụrụ na ị nabatabeghị Jizọs n'ime ndụ gị, ma ọ bụ ọ bụ na ị mela nke a oge ọ bụla, mana ị naghị adịri Ya ndụ ọzọ, ị nwere ike ịme nkwa ọhụrụ nye Ya TAA site n'ikpe ekpere dị mfe site n'ala ala obi gị. Ekpere ahụ nwere ike ịbụ ihe dị ka nke a,

“Jizọs, amaara m na abụ m onye mmehie, naanị Gị nwere ike ịtọhapụ m n'ahụhụ mmehie. A na m arịọ Gị ka Ị bata na ndụ m wee sachapụ m mmehie m niile. Nyere m aka ibiri Gị ndụ n'akụkụ nile nke ndụ m, ụbọchị nile nke ndụ m. Daalụ maka ịbata na ndụ m wee tọhapụ m!”

Ọ bụrụ na ị na-ekpe ekpere ahụ n'ezi obi, ikwere na Jizọs ga-eme ihe O kwuru na ọ ga-eme, ị ka natawo nzọpụta, ma gbanwee ọdịnihu ebighị ebi gị ịnọnyere ya ruo mgbe ebighị ebi! Ị Nwaka!

Ọ bụrụ na i meela mkpebi iso Kraịst, anyị ga-enwe mmasị ịnụ n’ọnụ gị, ma nyekwa gị akwụkwọ usoro ofufe ndị ọzọ iji nyere gị aka na njem ọhụrụ gị. Biko họrọ njikọ dị n'okpuru:

Ekpebiwo M Iso Kraịst!

Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

Ọtụtụ mkpebi na ndụ na-emetụta ihe ufọdụ. N’agbanyeghị, ọ bụ naanị otu kacha mkpa. Ọ bụrụ na ị na-achọ nduzi dị mfe maka nghọta miri emi nke mkpebi a pụrụ iche – onyinye nzọpụta nke Chineke n'efu – ya mere malite ebe a. Ewepụtara n’akwụkwọ ahụ, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig