Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!Ihe Atụ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

ỤBỌCHỊ 2 NKE 6

“Chineke Kere Gị buru Ebighị Ebi n’Uche”

Mgbe Chineke kere anyị, o nwere ihe karịrị atụmatụ afọ 70 ma ọ bụ 80 maka ịdị ndụ anyị. O nwere otu nzube maka ndụ anyị nịịle. Atụmatụ ya gbasara ndụ anyị n’ụwa, na nke elu-igwe (ma ọ bụ nke ebighi-ebi) anyị. Jemes 4:14 kọwara ọdịiche dị n’etiti ịdị adị abụọ anyị ndi a. Ọ na-ekwu,

“Gịnị bụ ndụ gị (nke ụwa)? Ọ bu alulu, nke nāputa ìhè nwa oge, emesia ọ we pua n'anya.” Jemes 4:14

Ị nụla okwu a, “Ndụ dị mkpụmkpụ.” N'ìhè nke ebighị-ebi, ọ bụ eziokwu! Akwụkwọ Nsọ kwuru,

“...ọ bu kwa ihe edebeworo madu ka ha nwua anwu nání otù mb͕e, ma mb͕e nka gasiri ikpé eso ya;” Ndi Hibru 9:27

Anyị niile aghaghị ịnwụ ọnwụ nke anụ ahụ. Ma ọnwụ nke anụ ahụ bụ naanị nkwụsị nke anụ ahụ anyị, ọ bụghị mkpụrụ obi anyị. Mkpụrụ obi anyị, ma ọ bụ ịdị ndụ anyị maara na-ebi n'ime ahụ anyị, dị ebighi ebi. Mkpụrụ obi anyị ga-anọ ebighị ebi n’otu n’ime ebe abụọ ndi a mgbe anyị nwụsịrị n’anụ ahụ: Eluigwe ma ọ bụ Ọkụ ala-mmụọ.

Eluigwe bụ paradaịs ebighị ebi ebe Chineke bi.

Ọkụ ala-mmụọ bụ nkewa zuru oke pụọ na Chineke.

Ịmụbata anyị n'ime ụwa a abụghị naanị mmalite nke ndụ nwa oge nke anyị, ndụ anụ ahụ n'ụwa, kama ọ bụ ndụ ime mmụọ anyị ebea ma gafere ruo mgbe ebighị ebi. Ya mere, n’iburu ebighị-ebi n’uche, ụfọdụ nwere ike ịhụ ndụ anyị n’ụwa ka ihe na-adịghị mkpa, ma nke a abụghị eziokwu kwụ-ọtọ. A ga-ekpebi ọdịnihu ebighị ebi gị site na mkpebi ndị ị na-eme n'oge ị nọ n'ụwa ebe a; nke kacha mkpa, mkpebi ime Jizọs Kraịst Onyenwe ndụ gị. Nzọpụta dịrị anyị niile site na Jizọs Kraịst, ọ bụ kwa site na naanị Ya ka anyị nwere ike ịgbanwe ọdịnihu anyị site n'inọ ebighị ebi n’ebe e kewapụrụ anyị na Chineke, ma nọrọ ebighị ebi n'eluigwe anyị na Chineke. Jizọs kwuru, sị:

“Mu onwem bu uzọ, na ezi-okwu, na ndu: ọ dighi onye ọ bula nābiakute Nnam, ma-ọbughi site na Mu.” Jọn 14:6

Mkpebi ndị anyị na-eme na ndụ anyị n’uwa dịkwa mkpa maka ihe ndị ọzọ. Otu anyị si ebi ndụ dị ka ndị kwere-ekwe nwere ike imetụta ọdịnihu ebighị nke ndị ọzọ na-amatabeghị Jizọs Kraịst dị ka Onye Nzọpụta ha. Kwa ụbọchị, ndị gbara anyị gburugburu na-ekiri ihe nlereanya anyị n’ibi ndụ n’ịhị Kraịst. Dị ka Ndị Kraịst, Chineke na-eji onye ọ bụla n'ime anyị eweta eluigwe nye ndị gbara anyị gburugburu bụ ndị na-amabeghị Ya. Jizọs kwuru, sị:

“Unu onwe-unu bu ìhè nke uwa…otu a menu ka ìhè-unu nēnwu n'iru madu, ka ha we hu ọlu ọma nile unu, we to Nna-unu Nke bi n'elu-igwe.” Matiu 5:14-16

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

Ọtụtụ mkpebi na ndụ na-emetụta ihe ufọdụ. N’agbanyeghị, ọ bụ naanị otu kacha mkpa. Ọ bụrụ na ị na-achọ nduzi dị mfe maka nghọta miri emi nke mkpebi a pụrụ iche – onyinye nzọpụta nke Chineke n'efu – ya mere malite ebe a. Ewepụtara n’akwụkwọ ahụ, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig