Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!Ihe Atụ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

ỤBỌCHỊ 5 NKE 6

“Baptism nke Mmiri: Nkwupụta Ndu nke Agbanwere n’ihu Ọha”

Baptism nke mmiri bụ ụzọ dị mkpa isi kwupụta nzọpụta gị n'ihu ọha. Baptism nke mmiri na-eme ememe njedebe nke ndụ ochie na mmalite nke ọhụrụ. Jizọs kụziri ndi nēso uzọ-Ya mkpa ọ dị ime Baptism nke mmrir tupu ya arịgoro n’eluigwe mgbe o bilitesịrị n’ọnwụ. Ọ sịrị,

“Ya mere, ganu, me mba nile ka ha buru ndi nēso uzọm, nēme ha baptism bà n'aha nke Nna, na nke Ọkpara, na nke Mọ Nsọ:” Matiu 28:19

N’ime Testament Ọhụrụ, e nwere ọtụtụ akụkọ gbasara ndị kwere ekwe emere baptism. Baptism nke mmiri n’egosi akara ịrịba ama nye ma onye a na-eme Baptisim, ma ndị na-ekiri ya. Baptism nke mmiri na-egosi n'ihu ọha: ọgwụgwụ nke ndụ nke mbụ gị site n'imikpu n'ime mmiri; mmalite nke ndụ ọhụrụ gị n’ime Kraịst site n’ịpụta na mmiri dika onye a sachara, dị ọcha na onye e kere ọhụrụ n’ime Chineke.

Luk 3:3 na-akowa Baptism nke mmiri dị ka “Baptism nke nchegharị,” ma na-ekwusi ike mkpa ọ dị ikwusa n’ihu ọha na anyị ahapụwo ndụ ochie anyị na mmehie anyị. Ọ bụ ezie na Baptism mmiri adịghị azọpụta anyị ma ọ bụ kpuchie mmehie anyị, ma ọ na-anọchi anya akụkụ dị oke mkpa nke ndụ Ndị Kraịst anyị – nkwupụta na ị bụ onye ekere ọhụrụ, ndụ gbanwere! Ọ bụrụ na e nwere onye ọ na-adịghị mkpa ikwupụta nkwupụta a, ọ bụ Jizọs, onye biri ndụ nke mmehie n’adighị n’ụwa ebe a. Ma Luk 3:21 kwuru. 'Ma mb͕e emere ndi-Ju nile baptism, o rue, mb͕e emesikwara Jisus baptism, mb͕e Ọ nēkpe kwa ekpere, na emeghere elu-igwe,’ Luk 3:21

E mere Jizọs baptizm ka anyị nwee ike isoro nzọ ụkwụ Ya. A pụghị ikọwaputacha uru baptizm nke mmiri bara. Ọ bụrụ na e mebeghị gị baptizm n’ime mmiri, i kwesịrị ime baptism nke ime mmiri ihe kachasi mkpa. Akwụkwọ Nsọ gwara anyị ka anyị mee nkwupụta n’ihu ọha banyere nzọpụta anyị, ọtụtụ chọọchị ndị kweere na akwụkwọ nsọ na-enyekwa ọtụtụ ohere ime baptizm. Ịgbaso ihe nlereanya nke Jizọs na-abụkarị ihe na-emeri emeri. Chineke ga-agọzi ma kwụọ gị ụgwọ maka ikwesị ntụkwasị obi na nrube isi gị nye Ya!

Ụbọchị 4Ụbọchị 6

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

Ọtụtụ mkpebi na ndụ na-emetụta ihe ufọdụ. N’agbanyeghị, ọ bụ naanị otu kacha mkpa. Ọ bụrụ na ị na-achọ nduzi dị mfe maka nghọta miri emi nke mkpebi a pụrụ iche – onyinye nzọpụta nke Chineke n'efu – ya mere malite ebe a. Ewepụtara n’akwụkwọ ahụ, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig