Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!Ihe Atụ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

ỤBỌCHỊ 3 NKE 6

“Anyị niile chọrọ Onye Nzọpụta”

Mgbe Chineke kere Adam na Iv, Ọ mere ha ka ha ghara ime mmehie, ha na Ya dịkwa ná-ezigbo mma. Mgbe ha nupụrụ isi n’iwu Chineke nke dị n’isi nke atọ nke Jenesis, ha webatara mmehie n’ime ndụ ha, nakwa n’ebe agbụrụ mmadụ nile nọ. Ndị Rom 3:23 kọwara mmetụta dị ukwuu nke mkpebi Adam na Iv nwere.

“... n'ihi na madu nile emehiewo, ha adighi-eru kwa otuto Chineke;” Ndi Rom 3:23

Ọ dịghị onye a gụpụrụ ná mmehie na ihe ọ na-akpata; ikpe mara onye ọ bụla n’ime anyị. N’ihi ya, anyị niile kewapụrụ n’ebe Chineke nọ. Mmehie anyị na-arụpụtakwa ntaramahụhụ ebighị ebi..

“N'ihi na ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” Ndị Rom 6:23a

N’ihi mkpebi Adam na Iv ime ka ha nupụrụ Chineke isi, ọnwụ ghọrọ ihe a na-apụghị ịgbanahụ nye ha na ụmụ ha nile (agbụrụ mmadụ); ma n’anụ ahụ ma na nke mmụọ. Mgbe ha dara, Chineke nọ na etiti mkpebi ndi a: ikwe ka mmadụ taa ahụhụ mmehie ya nke ga-akpata mbibi nke agbụrụ mmadụ, ma ọ bụ ịrọpụta ụzọ iji zọpụta mmadụ n’aka mmehie. Obi dị m ụtọ, dịka ngosipụta nke ịhụnanya na amara Ya nke kachasi, Chineke rọpụtara ụzọ nzọpụta site n'aka Ọkpara Ya.

“N'ihi na Chineke huru uwa n'anya otú a, na Ọ nyere ọbuná Ọkpara Ọ muru nání Ya, ka onye ọ bula nke kwere na Ya we ghara ila n'iyì, kama ka o nwe ndu ebighi-ebi.” Jọn 3:16

“...ma onyinye-amara nke Chineke bu ndu ebighi-ebi nime Kraist Jisus Onye-nwe-ayi.” Ndi Rom 6:23b

Ewezuga Jizọs Kraịst, ekpebiela na mmadụ ga-anwụ ọnwụ anụ ahụ na nke ime mmụọ; odighi ihe nwezuga ozo. Ma maka anyị ndị nọ na Kraịst, ọnwụ anụ ahụ ka na-echere anyị, ma ọnwụ ime mmụọ (Oku ala-mmụọ) adịghị. Kama, ndụ ebighị ebi n’Eluigwe na-echere anyị mgbe anyị hapụsịrị ụwa a. Site n'àjà zuru oke nke Jizọs Kraịst na mbilite n'ọnwụ ya, anyị na-agbanarị ntaramahụhụ ime mmụọ nke mmehie!

Ụbọchị 2Ụbọchị 4

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

Ọtụtụ mkpebi na ndụ na-emetụta ihe ufọdụ. N’agbanyeghị, ọ bụ naanị otu kacha mkpa. Ọ bụrụ na ị na-achọ nduzi dị mfe maka nghọta miri emi nke mkpebi a pụrụ iche – onyinye nzọpụta nke Chineke n'efu – ya mere malite ebe a. Ewepụtara n’akwụkwọ ahụ, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig