Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!Ihe Atụ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

ỤBỌCHỊ 1 NKE 6

“Chineke Ọ ga-ekwe ka ị bata n'Eluigwe?”

Chegodị echiche obere oge na oge gị n'ụwa abịala ná ngwụcha a na-atụghị anya ya. N'ihe ijuanya dị egwu, ị na-ahụ onwe gị ka ị na-eguzo n'ihu Onye Okere gị. Ka mgbagwoju anya na egwu gị tụgharịrị bụrụ atụmanya na obi ụtọ ịhụ ụlọ ebighị-ebi gị n'ikpeazụ, a kwụsị gị na mberede tupu ịbanye. Chineke a jụọ gị ajụjụ na-abanye n'obi, “Gịnị mere M ga-eji ahapụ gị Ị bata n'eluigwe?”

Kedi ka ị ga-esi zaghachị?

Obi dị m ụtọ na mgbe ụbọchị ahụ dị ebube ga-abịara onye ọ bụla n’ime anyị, Chineke agaghị agwa anyị ka anyị lechaa ule tupu anyị abanye. Ka o sina dị, ọnọdụ ahụ na-egosi onyonyo dị mkpa nakwa akpali echiche di mkpa nke eche na ọ ga-enyere anyị aka ịghọta nzọpụta nke ọma.

Ụfọdụ pụrụ ịza ajụjụ Chineke site n’ịtụ aka n’ihe ọma ndị ha meworo. Ndị ọzọ ga-akọwa otú ha si kwesị ntụkwasị obi na-ịga ụlọ-ụka, ndị ọzọ nwekwara ike depụta ihe ọjọọ niile ha na-ezere ná ndụ. Ọ bụ ezie na ihe ndị a bụ akụkụ dị mkpa nke ndụ Onye Kraịst ọ bụla, ha adịghị ekwe nkwa nzọpụta. Enwere naanị otu azịza ziri ezi maka ajụjụ a:

“Emewo m Jisus Kraịst Onyenwe ndụ m, ma O sachapụwokwa m pụọ a mmehie m nile.”

Okwu Chukwu

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

Ọtụtụ mkpebi na ndụ na-emetụta ihe ufọdụ. N’agbanyeghị, ọ bụ naanị otu kacha mkpa. Ọ bụrụ na ị na-achọ nduzi dị mfe maka nghọta miri emi nke mkpebi a pụrụ iche – onyinye nzọpụta nke Chineke n'efu – ya mere malite ebe a. Ewepụtara n’akwụkwọ ahụ, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig