Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!Ihe Atụ

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

ỤBỌCHỊ 4 NKE 6

“Nzọpụta: Akụkụ nke Chineke na Akụkụ nke Gị”

Nzọpụta gị na-ewetakọta mkpebi abụọ dị oke mkpa ọnụ. Mkpebi nke mbụ bụ nke Chineke mere ogologo oge gara aga izite Ọkpara ya n’ụwa ka ọ bụrụ naanị Onye Nzọpụta anyị. Nke abụọ bụ mkpebi gị ịnara Ọkpara Ya dịka Onye Nzọpụta gị.

“N'ihi na ọ bu amara ka ejiworo zọputa unu, site n'okwukwe; nka esiteghi kwa n'onwe-unu: ọ bu onyinye Chineke – o siteghi n'ọlu, ka onye ọ bula we ghara inya isi.” Ndi Efesọs 2:8-9

Akọwara AMARA dị ka ihu ọma a na-etorughịrị ma ọ bụ a na-ekwsighị ịnweta. Amara bụ na akụkụ nke Chineke na nzọpụta, ma Ọ na-enye mmadụ amara n'ụdị onyinye zuru oke, nke bụ Jizọs Kraịst. Site n'obe, Jizọs kwụrụ ụgwọ zuru oke maka ntaramahụhụ nke mmehie anyị. Ma site na Jizọs, amara nke Chineke n'onwe ya, ọ dịghị ọrụ ọma ọ bụla a chọrọ n'aka anyị, ma ọ bụ nke anyị nwere ike ịkwụ n’ụgwọ. Anyị enweghị ike inweta nzọpụta anyị; ọ bụ onyinye efu dịịrị mmadụ niile, n’enweghị ịkwụ ụgwọ ọ bụla n'akụkụ anyị.

A kọwara OKWUKWE dị ka ihe àmà na-egosi na ihe dị adị n’agbanyeghị na a pụghị ịhụ ya anya ma ọ bụ metụ ya aka. Okwukwe dị mkpa maka akụkụ anyị na nzọpụta, ma site n'okwukwe, site na omume nke si anyị n’obi pụta, anyị na-ahọrọ inyefe Chineke ndu anyị site n'ime Jizọs Onyenwe anyị. Ebe ị siteworo n'okwukwe nata amara nke Chineke site na Jizọs Kraịst, n’enweghị obi abụọ, n'enweghị ajụjụ ekpebiela na gị na Chineke g’anọ n'eluigwe. Ị nwere ike ijide eziokwu nke a aka 100%!

Ọ bụ ezie na ezi ọrụ apụghị inweta nzọpụta anyị, ha na-arụ ọrụ dị mkpa n’obibi ndụ nke Ndị Kraịst anyị mgbe anyị nabatasiri Jisọs.

“N'ihi na ayi bu ihe O mere, ndi ekère èkè nime Kraist Jisus ilu ezi ọ1u, nke Chineke buru uzọ dozie ka ayi we jegharia nime ha.” Ndi Efesos 2:10

Chineke nwere ezi nzube maka ndụ anyị nile, nke nkọwa ya nile dị n'etiti gị na Ya. Ma Chineke nwere otu nzube maka ụmụ Ya nile, nke bụ na anyị ga-etinye okwukwe anyị n'ọrụ site n'irụ ezi ọrụ. Mgbe anyị mere nke a, anyị na-emezu akụkụ dị mkpa nke atumatu Chineke maka ndụ anyị, ma nwee kwa ohere ịgosi ihe ùkwù nke ịhụnanya Ya n'ebe ndị ọzọ nọ. Nzọpụta bụ ma mmalite ọhụrụ na njedebe ma bụru ihe n’akpata ememe. Ị bụ onye ekere ọhụrụ, agbanwere ruo mgbe ebighị ebi!

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Mkpebi Kacha Ukwuu nke Ndụ Gị!

Ọtụtụ mkpebi na ndụ na-emetụta ihe ufọdụ. N’agbanyeghị, ọ bụ naanị otu kacha mkpa. Ọ bụrụ na ị na-achọ nduzi dị mfe maka nghọta miri emi nke mkpebi a pụrụ iche – onyinye nzọpụta nke Chineke n'efu – ya mere malite ebe a. Ewepụtara n’akwụkwọ ahụ, “Site n’ụwa a; Akwụkwọ ntuziaka Ndị Kraịst maka Uto na Nzube” nke David J. Swandt dere.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Twenty20 Faith, Inc. maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.twenty20faith.org/devotion1?lang=ig