Nwoke a gọziri agọziIhe Atụ
Nwute nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke
Otu ihe kachasị mkpa n'okwu bụ mkpebi nke na-emegasị gburugburu n'ebe mmadụ nọ bụ okwu nke na akpọ "nhọrọ".
Onye na-emebi iwu bụ onye ji aka ya họrọ ma kpebie n'obi ya na ọ gaghị abụ nwa Chineke, ọ gaghịkwanụ akpa agwa ka onye chọrọ iketa alaeze Chineke.
Ụzọ onye na-emebi iwu, agụụ nke ihe ọjọọ mere ka ọ họrọ ibi ndụ nke abụghị ụkpụrụ Chineke sịrị chọọ ya. Ụzọ nke onye na-emebi iwu bụ ụzọ nke jupụtara n'amaghị ihe na enweghi mkpachapụ anya. Ọ bụ ụzọ nke jupụtara n'ihe na-atọ anụ ahụ ụtọ.
Akwụkwọ nsọ kwuru n'akwụkwọ Ilu 14:12 nke kwuru sị : ekwere ụzọ dị nke ziri ezi n'anya mmadụ ma nsọtụ ya bụ ụzọ niile nke ọnwụ. Ihe mgbu nke ndị na-emebi iwu bụ n'ebe ọ na-ejedebe bụ n'ọnwụ ma ọnwụ nke mmụọ na nke anụ ahụ.
E kere mmadụ ka ọ dabere na Chineke maka na ekere ya n'oyiyi Chineke. N'akụkọ nwa lara akụ nna ya n'iyi na-akọwara anyị n'ụzọ nke onye na-emebi iwu agaghị adịcha ka ọ bụ ihe ịla n'iyi na mbụ ma n'ikpeazụ oga eme ka onye ahụ tie makwaara. (Luk 15:11-17)
Ọrụ nke Ekwensu: Ekwensu nwere ụzọ ọrụ atọ ; ka o zuo, gbuo ma laa n'iyi (Jọn 10:10). Onye ọbụla chọrọ ka ọ bụrụ onye agọziri agọzi ga-agba mbọ jụ ọnwụwa niile nke Ekwensu. Ekwensu na-aghọgbu onye ajọ omume mgbe gị na ya na-emekọ ihe.
Onye nke nwere ike imeri Ekwensu bụ onye nke a Chineke ma na-erube kwara okwu Chineke isi. Ilu 4:18-19, nke kwuru sị : Ụzọ ndị na-emebi iwu dịka ọchịchịrị, ha amaghị ihe n'eme ha ji asọ ngọngọ.
Mgbalapụ: ihe ga-eme ka anyị gbalapụ inwe ihe mwute nke ndị na-emebi iwu bụ ịgba mbọ soro nzom ụkwụ Jizọs, site n'igu akwụkwọ nsọ, iga ọgbakọ ụmụ Chineke na ị na ewuli mụọ anyị elu.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Ilu 1:10, Jọn 8:12, Mkpughe 20:5.
Ekpere: Nna zọpụta m n'ọnwụwa na ihe niile na-ebute mmebi iwu n'aha Jizọs.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Agwa dị iche iche ejiri mara onye ihe na-agara nke ọma. Nnyefe Kpam kpam na-arụtu aka na mkpughe, agwa ndị ejiri mara onye ihe ná-agara nke ọma. Nkesa nke onye ihe na-agara nke ọma na onye na-emebi iwu. Etu onye ihe na - agara nke ọma si a diri ndụ ogologo.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg