Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nwoke a gọziri agọziIhe Atụ

Nwoke a gọziri agọzi

ỤBỌCHỊ 2 NKE 5

Omenala Ndị Ngọzi

Obodo ọbụla nwere ụkpụrụ ha na-agbaro nke ha ji achikwa ma na-ahazi ndi nke ha. Ụkpụrụ ndụ ndị ihe na-agara nke ọma gbakwarasịrị ụkwụ na nrube isi ha banjere iwu na usoro nke alaeze Chineke. Dịka abụ ọma isi nke mbu amaokwu nke abụọ nke siri: Kama n'iwu Chineke ka ihe ụtọ ya dị, ọ bụkwa n'iwu ya ka ọ na-atụgharị uche ehihie na abali.

Site na nghọta nke Chineke: onye ihe na-agara nke ọma na-ewepụta omume ndi iche n'omume ndị uwa. Onye ọbụla chọrọ ibi ndụ n'ụkpụrụ nke alaeze eluigwe ga-abụ onye ma ihe e kwuru n'akwụkwọ nsọ (Matiu 6:33).

Ihe chịkọtara ụkpụrụ u nke onye ezi omume maọbụ onye ihe na-agara nke ọma.

Nsọpụrụ: Mgbe mmadu bidoro biakwute Chineke ma na-anọkwa Chineke nso na mmekọrịta ya na Chineke na nchegharị. Otu ihe omume nke ga-akacha mma banyere mmadu bụ iwu a na-agbaso maka ezi agwa bu nsopuru. N'akwụkwọ Matiu 6:9 si Mgbe nkea gasịrị, kpee, Nna anyi nọ n'eluigwe. Tupu Chineke agozie mmadụ, o ga-achọ ka onye ahụ bụrụ onye ji obi ya niile na ndụ ya niile na-asọpụrụ ya.

I sọpụrụ Chineke gunyere na mmadụ ga-efe Chineke ofufe ma dobe iwu ya. Ntụziaka nke Chineke nwere ike ịbịakwute anyị ozigbo site na mụọ nsọ nke na-agba àmà n'ime anyị maọbụ site na ndị na-anọchite anya Chineke. (ya bụ ndị isi anyị)

Ọ bụrụ na ị chọrọ ịsọpụrụ Chineke, anyị ga-abụ ndị na-erube isi n'usoro ọchịchị obodo ka anyị were keta oke n'ụkpụrụ ndị a na-asọpụrụ. (Efesọs 6:1-2).

N'agbanyeghị irube usoro ọchịchị obodo isi, onye ihe na-agara nke ọma agaghị eme ihe ga-eme ka ọ ghara ịsọpụrụ Chineke.

Ihe ọmụma atụ: Dịka ihe gbasara Joseph n'akwụkwọ nsọ Genesis 39:9 nke kwuru si, Joseph jụrụ ihe nwunye nna ya ukwu gwara ya mee maka na-ogbasoghi ụkpụrụ nke eji asọpụrụ Chineke.

Mgbe anyị na-asọpụrụ Chineke, anyị ga-adị ka osisi nke a kụrụ n'akụkụ mmiri nke akwụkwọ ya na-adịghị akpọnwụ ma na-amị mkpụrụ na-mgbe ya.

Ekpere: O nweghị ihe na-enwe isi n'alaeze Chineke ma ewepu ekpere.

Onye ihe na-agara nke ọma ga-abụ onye dị ike ekpere na ndụ ya. Mgbe anyị kpere ekpere, a na-ewogharị ma mejupụtara anyị n'ike ma mee Chineke obiọma na mbọ anyị na-agba (Luk 18:1).

Ihe Ọgụgụ ndị ọzọ: 2Kọrịnt 3:16-18, Ndi Rom 12:1-2, 2Kọrịnt 6:17

Ekpere: O Chineke nna nyere aka ka m na-asọpụrụ gị ma bụrụkwa ezigbo onye nnọchiteanya nke alaeze gị n'aha Jizọs.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nwoke a gọziri agọzi

Agwa dị iche iche ejiri mara onye ihe na-agara nke ọma. Nnyefe Kpam kpam na-arụtu aka na mkpughe, agwa ndị ejiri mara onye ihe ná-agara nke ọma. Nkesa nke onye ihe na-agara nke ọma na onye na-emebi iwu. Etu onye ihe na - agara nke ọma si a diri ndụ ogologo.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg