Nwoke a gọziri agọziIhe Atụ
Ụgwọ ọrụ nke ndị a gọziri agọzi
Chineke anyị bụ onye na-akwụghachi ụgwọ. N'akwụkwọ nsọ Hibru 11:6 sị onye na-enyeghachi ndị na-achọ ya ụgwọ ọlụ.
Ihe Ọ ga-efu Onye Ezi omume: Onye ọbụla nke họrọ ị bụ onye ezi omume n'ụwa a ga-anata ụgwọ ya. Jizọs kwuru n'akwụkwọ Jọn 15:18-20 si Ebe ụwa kpọrọ m asị, ụwa ga-akpọkwa unu asị. Ikpo asị gụnyere, ha ga-ajụ unu, ntaramahụhụ, nsọgbuo na ngọ nahụ.
Onye ezi omume agaghị abụ onye na-ebi ndụ, a gwara ọ gwa mgbe a na-akpagbu ya. N'agbanyeghị na ntaramahụhụ niile anyị ga-akwụdosike na nkwa Chineke. Chineke wepụtara onwe ya n'ịkwụ onye ezi omume ụgwọ ọlụ ya, ma ọ bụrụ na ọnọgide ruo na njedebe.
Chineke mazuru ụzọ niile nke onye ezi omume: Ụzọ nke onye ezi omume bụ ụzọ dị wara wara, ọ bụghị ụzọ nke na-anabata ihe adịghị ọcha. Onye ezi omume ga-anata ụgwọ ọlụ ya, ya mere ọ ga na-agba ọsọ ndụ site n'ilegide Jizọs anya, ma ọ bụ n'ọrịa, mgbe a jụrụ gị ajụ, na mgbe ntaramahụhụ, nkwenyesike gị ga-abụ na Chineke ma zuru na ọ gaghị agbahapụ/agharipu gị.
Dị ike na Mmụọ: Ọ bụrụ na-aga akwụghachi ndị ezi omume ụgwọ, Ị ga-agba mbọ bụrụ onye dị ike na mmụọ. Akwụkwọ ilu 18:14a siri na mmụọ mmadụ ga-anagide ọrịa ya. Onye ihe na-gara nke ọma ga-abụriri onye na-eto ma na-amụba na mmụọ siri ike site na ị bụ onye ga na-anwale mmụọ site n'ịbụ abụ na ikpe ekpere.
A na-agba onye ezi omume ume ka ọ ghara ị da mba kama ka ọ gbalịe na-aga n'ụzọ nke onye ezi omume site na-enyemaka nke mmụọ nsọ. A na-agba anyị ume ka anyị bụrụ ndị ga-anọgide n'ịkụ mkpụrụ nke mmụọ nsọ, ka anyị wee merie ọchịchọ nke anụ ahụ. Maka na Chineke mara ụzọ nke onye ezi omume, anyị ga-atụkwasị ya obi ka ọ napụta anyị n'ihe ụfụ dị iche iche nke ụwa.
Ihe ọgụgụ ndị ozo: Gal. 6:7-9, Mkpughe 22:12-13, Ilu 3:5-6
Ekpere: Nna site n'ebere gị jidesie m n'ụzọ nke onye ezi omume ruo n'ọgwụgwụ/njedebe n'aha Jizọs.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Agwa dị iche iche ejiri mara onye ihe na-agara nke ọma. Nnyefe Kpam kpam na-arụtu aka na mkpughe, agwa ndị ejiri mara onye ihe ná-agara nke ọma. Nkesa nke onye ihe na-agara nke ọma na onye na-emebi iwu. Etu onye ihe na - agara nke ọma si a diri ndụ ogologo.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg