Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Nwoke a gọziri agọziIhe Atụ

Nwoke a gọziri agọzi

ỤBỌCHỊ 4 NKE 5

Ihe Nzuzo nke Ndi Ngozi

Njem nke ndụ dịka ahịa a na-azụ azụ. Site n'ụbọchị mbụ a mụbatara nwatakịrị n'ụwa a, ọtụtụ ihe abanyela ya n'ime o were ike bụrụ na inye ya nri maọbụ mgbe a na-azụ ya. A na-eme nkea ka nwata ahụ baa uru mgbe otolitere ghọọ okenye.

Ịkụ Chineke dịka mkpụrụ: Ngozi nke onye ihe na-agara nke ọma bụ na-akụrụ ya dị ka mkpụrụ. Akwụkwọ nsọ merela anyị mata ma kọwaara anyị na dịka onye ihe na-agara nke ọma na-akụrụ ya dịka osisi akụrụ n'akụkụ mmiri nke na-amị mkpụrụ na mgbe ya ma onye na-emebi iwu dịka ntụ ọka nke ifufe na-ebufu.

Onye ihe na-agara nke ọma gbara mgbọrọgwụ site n'ịnọgide n'ime Jizọs Kraịst. Ihe niile mejupụtara ndụ ya bụ ihe gbasara Kraịst. Kọlọsi 1:27 nke kwuru si : Kraịst n'ime unu, bụ olile anya nke ebube ahụ. Ịkụnye mmadụ n'ime Kraist bụ ihe nzuzo nke ndị agọziri agọzi.

Ịkụ Mkpụrụ n'ime Ụlọ nsọ Chineke: ihe niile Chineke na-emere anyị n'oge dị ugbua bụ na ọ chọrọ ịwụ ụlọ ụka ya. Ịzụ onye ihe na-gara nke ọma bido na inye ya mmiri ara nke akwụkwọ nsọ ruo na inye ya nri siri ike nke akwụkwọ nsọ (Hibru 5:12-14).

Ha bụ ndị azụlitere n'usoro obibi ndụ nke ụlọ nsọ Chineke ka ha were ya fee Chineke. Chineke ji onyinye amara ndịa were chọọ anyị mma maka iketa alaeze Chineke.

Ịnwetacha uru n'ọkụkụ Mkpụrụ nke Anyị: Efesọs 3:17 nke kwuru si ka Kraist wee site n'okwukwe unu bigide n'ime obi unu, ka unu, ebe unu gbagidereworo mgbọrọgwụ n'ime ịhụnanya.

Kemgbe, obi anyị bụ ihe zukọtaraọnụ gbanyere akụkụ ahụ niile ma ime ahụ, ma etiti, mgbe Chineke mere obi anyị ebe obibi ya, ọ ga-ahazi ihe niile gbasara anyị ma na-enyekwa anyị ihe niile, na-agba anyị ume gbasara ime mụọ anyị. Mmadụ nke ga irite akụ na ụba nke Kraist, ga-abụ onye gbanyere mkpọrọgwụ n'ịhụnanya.

Ihe ndị ahụ nke na ahụghị n'ime Kraist agaghị abanye mgbọrọgwụ n'ime ya. Igbanye mgbọrọgwụ dị ka ala akọrọ ihe ebe ịnọgide dị ka ụlo. Ụlọ nsọ Chineke bụ ala akọrọ ihe (1Kronti 3:9), ọ bụ kwa ụlọ nsọ ya (Mat. 16:18). Uru a na-erite n'alaeze bụ na mmadụ kunyere onwe ya n'ime Kraist.

Ihe Ọgụgụ ndị ọzọ: 2 Kọrịnt.5:17, 1Tim.1:14, Mkpughe 2:4-5

Ekpere: Nna, chekwaba m n'ịhụnanya gị, biko ekwela ka ihe ọbụla megharịa m anya na njem nke ndụ, N'aha Jizọs Kraist.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Nwoke a gọziri agọzi

Agwa dị iche iche ejiri mara onye ihe na-agara nke ọma. Nnyefe Kpam kpam na-arụtu aka na mkpughe, agwa ndị ejiri mara onye ihe ná-agara nke ọma. Nkesa nke onye ihe na-agara nke ọma na onye na-emebi iwu. Etu onye ihe na - agara nke ọma si a diri ndụ ogologo.

More

Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg