Nwoke a gọziri agọziIhe Atụ
Ụzọ ndụ ndị a gọziri agọzi
N'ebea, na-akọwara anyị maka akparamagwa na ụdịdị obibi ndụ onye ihe na-agara nke ọma. Onye agọziri agọzi N'ebea bụ nwa Chineke. O bụ onye ndụ ya na-achi omume onye azụrụ azụ na n'ụkpụrụ ikike iwu banyere alaeze Chineke.
Onyonyo maọbụ nkọwa onye agọziri agọzi maọbụ onye ihe na-agara nkeọma.
Ndụ onye ihe na-agara nke ọma bụ n'okwu Chineke ka ọ na-adabere ọ bụghị n'okwu ndị mmadụ maọbụ dịka omenaala si dị. (James 1:25).
Onye ihe na-agara nke ọma maara etu esi anọdụ ọdụ, etu esi aga ije na etu esi eguzo. Dika anyị hụrụ u n'akwụkwọ abụ ọma isi nke mbụ amaokwu nke mbụ nke kwụrụ si: Onye ihe na-agara nke ọma ka mmadụ ahu bụ nke na-ejeghi ije na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu. Nke eguzoghikwa n'ụzọ ndị mmehie. Nke na-anọghị kwa n'ọnọdụ ndị na akwa emo.
Ọ bụrụ na ị chọrọ ka ahụta gi dịka onyonyo onye ihe na-agara nke ọma, ị ga abụ onye nyefere onwe ya n' ịgụ ma na-atụgharị uche n'okwu nke Chineke.
Okwu Chineke nwezuru ihe nke nwere ikike ka mmadu ga ije dị mfemaka onye agọziri agozi.
Ihe ọgụgụ ndị ọzọ: Abụ Ọma 119:130, Luk 5:5, Abụ Ọma 119:1-5
Ekpere: Nna, nye m amara iji na-atụle ma na-ebuere okwu gị isi mgbe niile n'aha Jizọs.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Agwa dị iche iche ejiri mara onye ihe na-agara nke ọma. Nnyefe Kpam kpam na-arụtu aka na mkpughe, agwa ndị ejiri mara onye ihe ná-agara nke ọma. Nkesa nke onye ihe na-agara nke ọma na onye na-emebi iwu. Etu onye ihe na - agara nke ọma si a diri ndụ ogologo.
More
Ọ ga-amasị anyị ikele Kingsley Onuoha maka ịnye atụmatụ a. Maka ozi ndị ọzọ, biko gaa na: https://www.facebook.com/share/LYhjtr4Q4g4vVza7/?mibextid=qi2Omg