Onye ihe nāgara nke-ọma ka madu ahu bu nke nējeghi ije na ndumọdu ndi nēmebi iwu, Nke nēguzoghi kwa n'uzọ ndi nmehie, Nke nānọghi kwa n'ọnọdu ndi nākwa emò. Kama n'iwu Jehova ka ihe-utọ-ya di; Ọ bu kwa n'iwu-Ya ka ọ nātughari uche ehihie na abali. Ọ gādi kwa ka osisi akuworo n'akuku iyi juputara na miri, Nke nāmi nkpuru-ya na mb͕e-ya, Ọzọ, akwukwọ-ya adighi-akpọnwu; Ihe ọ bula kwa nke ọ nēme, ọ nēme ka ọ ga nke-ọma. Ọ bughi otú a ka ndi nēmebi iwu di; Kama ha di ka ib͕ob͕o-ọka nke ifufe nēfesa. N'ihi nka ndi nēmebi iwu agaghi-eguzosi ike n'ikpé, Ndi-nmehie agaghi-eguzosi kwa ike na nzukọ ndi ezi omume.
Gụọ ABÙ ỌMA 1
Geere nke a ntị ABÙ ỌMA 1
Kesaa
Tulee Ụdị Nsụgharị Niile Dị Nụ: ABÙ ỌMA 1:1-5
Chekwaa ma ọ bụ debe amaokwu gasị, gụọ ihe na-anọghị n'ịntanetị, lelee obere vidiyo gasị a kụziri ihe na ha, na ndị ọzọ!
Ebe Mmepe Nke Mbụ Nke Ngwá
Akwụkwọ Nsọ
Atụmatụ Ihe Ogụgụ Gasị
Vidiyo Gasị