Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Chineke Bụ _______Ihe Atụ

God Is _______

ỤBỌCHỊ 6 NKE 6

Ònye Ka Chineke Bụ Nye Gị?

Weregọdị ya na ị na-ahụ ka ụmụnne abụọ na-akọwa maka Nna ha. Ofụ nwere ike ilekwasị anya n'otú Nna ha si bụrụ onye na-akpa ọchị, di agbanweghi agbanwe, bụrụ onye ịhụnanya, ebe nke ọzọ nwere ike ilekwasị anya n'omume ọrụ, idi ntụkwasị obi, ma ọ bụ ndidi Nna ha. Ụmụaka abụọ a na-akọwa maka ofụ onye, mana ha abụọ nwere ahụmahụ pụrụ iche nke na-emetụta otú ha si ele Nna ha anya.

N’otu aka ahụ, ụmụ Chineke niile na-ahụta Ya n’ụzọ dịtụ iche iche, nke mere na ụfọdụ umu Ya nwere ike tinyekwụọ anya na ịdị nsọ na ike nke Ya, ma ndị ọzọ nwere ike na-atụgharịkwu uche na nnukwu obi ebere na ebere nke Ya. Otu ụzọ ọ bụla esi hụta Chineke, Chineke bụ Nna zuru oke, ma àgwà Ya na Okwu Ya kwekọritara.

Ma Chineke na-ekpụghekwa onwe Ya nye onye ọbụla n'ime anyị n'otu n'otu. Ya mere na otú i si akọwa Chineke nwere ike ọ gaghị ada kpọmkwem otú enyi gị ga-esi akọwa maka Ya, nke ahụ dịkwa nma! Ihe bụ́ isi bụ na anyị kwesiri igbali mgbe niile ịhụ na echiche anyị banyere Chineke kwekọrọ n’ihe edere n'Okwu Ya maka Ya.

N'ihi ịhụ Chineke ka Ọ na-arụ ọrụ na ndụ anyị n'ụzọ dị iche iche, ịbịakọta ọnụ na-enye anyị nkọwa zuru oke banyere onye Ọ bụ. Ikekwe, n'oge ọrịa, ị hụla Chineke dị ka Onye na-agwọ gi ọrịa, ebe enyi gị nwere akụkọ na-enweghị atụ maka Chineke dị ka Onye na-enye ya ihe ndi ya chọrọ. Ahụmahụ abụọ ndia na-eme ka okwukwe anyị sikwụọ ike ma na-enyere anyị aka ịmatakwu onye Chineke bụ.

Abụ Ọma na-enye ezigbọ ihe atụ maka nke a. Anyị na-ahụ ma abụ ákwá ma abụ otuto, nke ọ bụla na-elekwasị anya n’ihe dị iche iche banyere Chineke. Anyị na-achọpụta Chineke bụ onye nkasi obi na ebe mgbaba n'oge nsogbu na kwa Chineke bụ isi iyi nke ọñụ anyị.

Nsogbu na-abịa mgbe otú anyị si ele Chineke anya dabeere n'ọnọdụ anyị kama n'ịchọ Chineke n'etiti ha. Mgbe anyị na-ele Chineke anya site na mmetụta nke onwe anyị nke oge a, anyị ga-ahụ chi nke dị ka ọ yiri anyị. Ma ọ bụ anyị ekee chi nke di naani ime ihe ọbụla anyi chọrọ ya ka ọ mee.

Ma mgbe anyị na-ahọrọ ịtụle ezi àgwà nke Chineke n'etiti ọnọdụ anyị, nke ahụ bụ ebe anyị ga-ahụ olileanya, udo, nkasi obi na ọñụ.

Ya mere, onye ka Chineke bụ nye gi?

Ịchọta azịza ahụ nwere ike ịbụ ihe nchụso ndụ gi niile, mana ọ ga-abụ ajụjụ kacha mkpa anyị na-atụgharị n'uche.

Kpee ekpere: Chineke, ekelee m gị maka ịdi enweghị njedebe na idị karia ka enyi obi m. Ama m Gị dị ka _______, ma ekwekwara m na Ị bụ _______. Nyere m aka ka m gbazie ma kụsaa asi ọ bụla m ka kwenyere gbasara Gị, nyekwa m ahụmịhe karịri akari nke na-egọsi m otu àgwà gị di n'ezie. Nyere m aka ka m kwụsị ịdabere echiche m banyere Gị n'ọnọdụ ndụ m kama ka m malite chọwa Gị n'etiti ha. N’aha Jizọs, amen.

Ihe ịma aka: Laghachi azụ hụ ndepụta gị site na ụbọchị nke mbụ. Kedu ihe ọzọ ị ga-etinyekwu? Chee echiche banyere ahụmahụ onwe gi ọ bụla ị nwere gbasara àgwà Chineke ndi ahu idetụrụ. Detụọ ihe gbasara àgwà ndi ahu iji chetara onwe gị mgbe ọbụla ị malitere ịjụ onwe gi ajuju gbasara àgwà Ya.

Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ a na-esọ usọrọ ọzi sitere na Life.Church na Ụkọ Chụkwụ Craig Groeschel. Chọtakwụọ ihe ọzọ na www.ndụ.ụlọụka/Chinekebụ

Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

God Is _______

Ònye ka Chineke bụ? Anyị niile nwere azịza dị iche iche, mana olee otu anyị ga esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwere ebe gị na Chineke, gi na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gi na ndi ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—n'íhé, ugbu a, na di njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị isii na-esọ usoro ozi Ukọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke bụ _______.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/