Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Chineke Bụ _______Ihe Atụ

God Is _______

ỤBỌCHỊ 4 NKE 6

Chineke Nọ Ebe A

“… jide nke a n'aka: Anọnyeere M unu mgbe niile, ọbụnadi rụọ n'ọgwụgwụ nke oge a.”Matịu 28:20 NLT

Chineke n'achọkari mmekọrita Ya na umu mmadu, anyị na-ahụkwa ọchịchọ ahụ ka ọ n'egọsipụta n'ụzọ dị iche iche ka oge na-aga.

Na mmalite, Chineke biiri ma jee ije n’etiti Adam na Iv n’ime ogige Eden. Mgbe ha mehiere, ọ mebiri mmekọrịta anyị na Ya mana ọ kwụsịghị atụmatụ Ya ịbịaru anyị nso.

Chineke Nna zitere Jizọs n'ụwa ka Ọ dozie mmekọrịta anyị na Ya, n'otu n'ime okwu ndi ikpeazụ Jizọs kwụrụ n'ụwa, Ọ kwere nkwa na Ya ga-anọnyere anyị mgbe niile. Nke ka nke ahụ, Ọ kwere ndị na-eso ụzọ Ya nkwa na ha ga-anata Mmụọ Nsọ, onye ga-abụ Chineke n'ime anyi.

Mgbe anyị na-esọ Kraịst, Mmụọ Nsọ Chineke adighị naanị inọyeere anyi—Ọ nọ n'ime anyi. N’ime Agba Ochie, ndị mmadụ na-aga n’ụlọ nsọ ka ha hụ ọnụnọ nke Chineke. Ma ugbu a, mgbe anyị nabatara Jizọs, anyị bụ ụlọ nsọ ebe Mmụọ nke Chineke bi.

N’oge niile, Chineke chọrọ ịbịaru anyị nso, ma site n’aka Jizọs, nke ahụ abụrụla eziokwu ọzọ. Ma ọ bụ ezie na anyị na-echere ụbọchị nke Chineke ga-eme ka ihe niile dị ọhụrụ ka anyị na Ya wee nwee ike ibi n'alaeze Ya zuru oke, anyị adighị gbara aka n'eche rụọ mgbe nke ahụ mere. Chineke enyewọ anyị ọrụ ka anyị na-arụ.

Site ná mmalite, Ọ chọrọ ka ụmụ mmadụ na-achị ihe ndi Ọ kere eke. Ọ nyewọ anyị onyinye na ihe ọmụme nke anyị ji arụ ọrụ Ya n'ụwa a, ya mere na nzọpụta abụghị naanị ihe ụzọ mmepe ịga eluigwe—ọ bụ ọkpụkpọ òkù ịbanye n'ọrụ ina-ebụtekwu ihe eluigwe bia n'ụwa a.

Ma ka anyị na-eme nke a, anyị agaghị n'arụ ọrụ n'ike nke onwe anyị. Anyị na Chineke ga na-akpakọrịta, na-adabere na Mmụọ Ya di n'ime anyị maka ike ime ihe ọ bụla. Ewezụga Chineke, anyị enweghị ike ime ihe ọ bụla, mana dịka ndi ụlọ nsọ nke Chineke dị ndụ ndi Mmụọ Ya bi n'ime ha, anyị nwere ike ime karịa ka anyị chere na ọ kwere omume.

Anyi na-enwekarị ọnwụnwa iche na Chineke dị ka onye nọ n’ebe dị anya na mbara igwe, ma n'akpọkwa Ya aha dị ka “onye ukwu bi n’elu.” Ma Chineke anyị nọ ebe a.

Mgbe anyị makwara na ọnụnọ Chineke nọnyeere anyị nakwa nọrọ n’ime anyị, anyị nwere ike gaa n'ihu rụwa ọrụ n’nzube Ọ nwere maka anyị—ịkọrọ ndị ọzọ ozi ọma Ya na iweta ọtụtụ ihe ọma Ya n’ụwa a.

Kpee ekpere: Chineke, ekelee m Gị na ka m na-akpọbata Jizọs n’ime ndụ m, Ọ bụghị naanị na Ị nọnyeere m kamakwa Ị nọ n’ime m! A na m arịọ ka Mmụọ Nsọ Gị maziere m ma dụzie m n’ụbọchị taa. Gosi m ka m ga-esi weta ọtụtụ ala-eze Gị ebe a n’ụwa a, ma ekeleekwa m Gị maka iso mmadụ na-akpakọrịta maka ime uche Gị. A tụkwasịrị Gị obi, na arịọkwa maka mmata nke ukwuu nke ọnụnọ Gị taa. N’aha Jizọs, amen.

Ihe ịma aka: Ka ị na-adabere n’ime ọnụnọ Chineke taa, tinye uche pụrụ iche n’ihe ọ bụla ọ dị gị ka Mmụọ Nsọ Ọ na-akpali gị ime, ma rịọ Ya maka obi sie ike ime ya!

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

God Is _______

Ònye ka Chineke bụ? Anyị niile nwere azịza dị iche iche, mana olee otu anyị ga esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwere ebe gị na Chineke, gi na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gi na ndi ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—n'íhé, ugbu a, na di njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị isii na-esọ usoro ozi Ukọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke bụ _______.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/