Chineke Bụ _______Ihe Atụ
Ònye Ka Chineke Bụ?
Chineke bu _______.
Olee okwu gbatara gi n'uche ozugbo? Eleghị anya, ị maara Chineke dị ka Nna gi hụru gi n'anya. Ọ nwere ike bụrụ na ị hụla Chineke dị ka onye na-agwọ gị oria ma ọ bụ onye na-enye gị ihe ndi ichọrọ. Ma ọ bụ na ị na-eche na Chineke dị anya, bụrụ onye iwe, ma ọ bụ bụrụ onye jụpụtara n'ikpe ikpe.
N'agbanyeghị otú ịsi zaa ya, otú isi ele Chineke anya buru ibu dị ụkwụụ n'ime ndụ gị. N’ezie, Ụkọ Chukwu na odee akwụkwọ a ma ama A.W. Tozer dere, sị: “Ihe na-abata n’ime obi anyi mgbe anyị na-eche banyere Chineke bụ ihe kachasi mkpa gbasara anyị.”
Echiche anyị banyere Chineke na-emetụta otú anyị si ele onwe anyị anya, otu anyị si ele ndị ọzọ anya, na otu anyị si ele ụwa gbara anyị gburugburu anya. Ọ bụ ya mere ọ ji dị oke mkpa iwụlite ntọala anyị nke onye Chineke bụ di ndabere na eziokwu na-adịghị agbanwe agbanwe nke Okwu Ya—na adịghị dabere n'ọnọdụ mmetụta anyị nke n'adighi adigide.
Ọ nwere ike buru na ị nwetawọ iru újú, mfu, ma ọ bụ ndakpọ olileanya nke mere ka Ị na ewesara Chineke iwe ma obu n'ahụta Ya dika Ọ mere gi ihe ụfụ obi. Ọ nwere ike bụru na ị hụla Ndị Nso Ụzọ Kraịsti ndị ọzọ ndi mere gi ka ọ dika e kpere gi ikpe ma kwụgide gi dika onye dara iwu, n’ihi ya, gi wee chee na Chineke dikwa otu ahu. Ikekwe ị nwara ikpesara Chineke ekpere ma ọ bụ chọọ ka gi na Ya jikọọ, mana i nweghị mmetụta obula, ya mee gi chee na Chineke dị anya, di oyi, na Ọ dighi eche echiche banyere gi.
Ahụmahụ na mmetụta ndị ahụ ziri ezi, ma ha abụghị ihe ngọsipụta ziri ezi gbasara àgwà Chineke.
N’ezie, ịgbagọ ụzọ anyị si ahuta Chineke bụ otu n’ime ụzọ onye iro si eme ihe kemgbe mmalite. N’ime ogige Iden zuru okè, Chineke so Adam na Iv jee ije, nye ha naanị otu ogige: Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ịma ihe. Mana onye iro wụbatara, jụọ Iv ma Chineke n'ezie Ọ kwụrụ na ya bụ Iv apụghị iri mkpụrụ osisi ahụ, ma mee ka ọ dọọ ya anya na Chineke na-egbọchi ya ịnwete ihe ọ chọrọ n’ezie.
N’ihi ya, Iv riri mkpụrụ osisi ahụ, mmehie wee bata n’ụwa, mebie mmekọrịta anyị na Chineke.
Agbanyeghi n'ime ihe ndi a niile, àgwà Chineke agbanweghi. Ọ ji ịhụnanya nye Adam na Iv ihe mkpuchi, bụ́ nke gọsipụtara ọdinihu omume ịhụnanya Ya nke kachasi: bụ́ izite Ọkpara Ya zuru okè, Jizọs, ka Ọ bie ndụ n’emeghị mmehie ma nwụọ n’ọnọdụ anyị iji weghachita mmekọrịta anyị na Ya.
Mgbe ụfọdụ ọdi ọnwụnwa iche na Chineke nke Agba Ochie bụ naanị Chineke okpe ikpe, na ọ bụ naanị n’ime Agba Ọhụrụ ka anyị na-ahụ ebere site n’aka Jizọs. Ma n’eziọkwụ, Chineke nọ kemgbe n’ime ọrụ nke ịchụso ndị mmehie n’obiọma Ya tụpụ anyị echeedi maka ichụso Ya. Ọ kwesịri ntụkwasị obi mgbe niile imezụ nkwa Ya. Ọ bụ Ọnye ezi omume na Ọnye obi ebere mgbe nile, bụrụ Ọnye dị nsọ na Ọnye ịhụnanya, Ọnye isi ọchịchị na Ọnye na-adịghị agbanwe agbanwe.
Àgwà Chineke dị omimi nke ụkwụụ, baa ọgaranya, dịkwa nnukwu nke a pụrụ ịkọwa n'ụzọ zuru ezu, anyị ana-ahụ ihe na-egọsi ya n'ime Akwụkwọ Nsọ niile.
Ya mere, ka ị na-eche banyere Chineke, tụlee otú i si n'ele Ya anya. Ọ dabere na eziokwu nke Okwu Ya ka ọ dabere n'ahụmahụ gị nke ihe mgbu gi ndi gara aga?
N’ime ụbọchị ole na ole sochirinụ, anyị ga-enyocha àgwà ole na ole gbasara Chineke site n’Akwụkwọ Nsọ. Dị ka anyị na-achọpụta ha, rịọ Chineke ka Ọ kpụghekwụọrọ gị onwe Ya. N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ ịnwere n'ebe Chineke nọ, n'ebe Ndị Nso Uzo Kraịsti nọ, ma ọ bụ n'ebe ndi ụka nọ, mara nke a: Chineke nke eluigwe na ala kere gị, hụ gị n'anya, ma na-achụso gị n'ike n'ike.
Kpee ekpere: Chineke, aghọtara m na echiche m banyere onye Ị bụ na-adaberekarị n'ozi n'ezụghị ezụ. Gosi m ụgha ọ bụla m na-ekwere gbasara Gị ma jiri eziọkwụ dochie ha. Kpụghekwụọrọ m onwe Gị na agwa Gị taa. N’aha Jizọs, amen.
Ihe ịma aka: Dejụpụta nkwụpụta a: Chineke bụ _______. Dee ọtụtụ okwu ole na ole ị na-eche, ma chọta amaokwu Akwụkwọ Nsọ ndị so ha iji kwadọ ha.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ònye ka Chineke bụ? Anyị niile nwere azịza dị iche iche, mana olee otu anyị ga esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwere ebe gị na Chineke, gi na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gi na ndi ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—n'íhé, ugbu a, na di njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị isii na-esọ usoro ozi Ukọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke bụ _______.
More