Chineke Bụ _______Ihe Atụ
Chineke Kwesịrị Ntụkwasị Obi
Ma [Onye-nwe-anyị] wee gabiga n'ihu Mọzis, n'ekwu Si, “Onye-nwe-anyi, Onye-nwe-anyị, nke di nnukwu obi ebere na amara Chineke, nke n'adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, bara ụba na ịhụnanya na ntụkwasị obi, na-egọsigide puku kwụrụ puku ịhụnanya Ya, na agbaghara ajọ omume, nnupụisi na mmehie. Ma Ọ dighi-arapụ onye n'ēmebi iwu ka ọ ghara inata ntarama ahuhu; Ọ na-ata ụmụ-ntakịrị ha na ụmụ ntakiri ndi n'ēsọte ha ahụhụ maka mmehie nke ndị mụrụ ha rụọ ọgbọ nke atọ na nke anọ.” Ọpụpụ 34:6-7 NIV
Anyị enyọchala àgwà ole na ole nke Chineke, anyị pụkwara ịhụ ọtụtụ àgwà ndị ọzọ bụ nke Ya n’ime Akwụkwọ Nsọ. Ma n’Ọpụpụ Isi nke Iri Atọ na Anọ, Chineke kpụgheere Mọzis ihe ise kpọmkwem banyere onwe Ya: Ọ di nnukwu obi ebere, na-eme amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, di ịhụnanya, nadi ntụkwasị obi.
N'otu okwu chukwu nke a, Chineke gwara Mọzis na Ọ dịghịkwa ekwe ka ndị ikpe mara gaa n'ihu n'enwetaghị ntaramahụhụ. Ọ dị ka mgbanwe na-agbagwoju anya, ọ kwa ya? Chineke chọrọ ka ndị Ya mata na Ọ di ịhụnanya na ikwesị ntụkwasị obi na Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ… mana Ọ ga-atakwa ndị mehiere ahụhụ. Kedu ka anyị ga-esi mee ka esemokwu ahụ nke di n'etiti ikpe ziri ezi nke Chineke na ịhụnanya Ya dị njikọ?
N'imalite, anyị na-elekari ihe ọbula anya ka ọdi ọji ka ọdi ọcha. Mana Chineke gafere ihe mkpakọ ndi ahu niile anyị na-agbalị itinye Ya n'ime ha. Ọ bụghị nanị na Ọ di ịhụnanya—Ọ bụkwa onye ezi omume, nke mere na Ọ pụghị ikwe ka onye ikpe mara na-aga n'enweghị ntaramahụhụ. Ma Ọ na-emekwa ebere, nke pụtara na mgbe Ọ na-ata ọgbọ ole na ole ahụhụ, Ọ na-egọsi ọtụtụ puku ha ịhụnanya Ya.
Ịhụnanya Chineke na ikpe Ya ziri ezi ka a gbara ìhè n’ime Akwụkwọ Nsọ. Ha bụ nnukwu ihe ndi ama ama nke ikwesị ntụkwasị obi Ya.
Atụmatụ dị ebube nke Chineke iweghachi mmekọrịta anyị na Ya malitere site na nkwa Ọ kwere Ebraham na Sera n'ime Jenesis. Ọ kwụrụ na Ya ga-esi n’agbụrụ ha gọzie ụwa—nkwa ahụ ka e mezụrụ n’ime Jizọs.
Mana anyị bu ụmụ mmadụ na-aga n'ihu n'emeghi ihe ndi kwesịri ka anyi mee n'ime mkwekọrita ahụ. Dị ka Mọzis na Chineke n'akparita uka, ndị umu Izrel enweghịzi ndidi ma kpebie ife ihe oyiyi nwa ehi akpụrụ n'ọlaedo kama ifezi Chineke. Ma n’ihi ikwesị ntụkwasị obi Ya nye nkwa Ya, Chineke ebibighi ha.
Kama nke ahụ, ndị nọgidere na-enupụrụ Ya isi wee si n’ebe Ọ nọ pụọ na-enweta ntaramahụhụ, ma ndị chegharịrị ka Ọ na-enye ohere ọzọ.
N'ọtụtụ ọdịda ndị ọzọ nke ụmụ mmadụ, ikwesị ntụkwasị obi nke Chineke ka dị, nke pụtara ìhè site n'aka Jizọs Onye mezụrụ nkwa Chineke.
Ya mere, oge ọ bụla anyị mejọrọ ma ọ bụ di erughi eru ọzọ, anyị nwere ike igbaghachikwụte Chineke, na-enwe ekele na ọdịda anyị adịghị ebelata ikwesị ntụkwasị obi Chineke ịgbaghara na ịkwadọ nkwa Ya.
Kpee ekpere: Chineke, ekelee m Gị maka ikwesị ntụkwasị obi Gị site n’aka Jizọs na n’ime ndụ m niile. Ọbụnadi mgbe m na-ekwesịghị ntụkwasị obi na mgbe m dara, Ị daghi mbà nye m n'ihe ọbụla, ana m etọkwa Gị maka nke ahụ. Nye m anya ka m hụ ikwesị ntụkwasị obi Gị ka ọ n'arụ ọrụ, ma zụlite okwukwe m n'ime usoro ahụ. N’aha Jizọs, amen.
Ihe ịma aka: Tụgharịa uche gbasara otutu oge n'ime ndụ gị ebe ị hụwọrọ ikwesị ntụkwasị obi nke Chineke. Tụlee ime ndepụta maka nke ahu iji n'arụtụrụ onwe gi aka mgbe kwa mgbe.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ònye ka Chineke bụ? Anyị niile nwere azịza dị iche iche, mana olee otu anyị ga esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwere ebe gị na Chineke, gi na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gi na ndi ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—n'íhé, ugbu a, na di njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị isii na-esọ usoro ozi Ukọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke bụ _______.
More