Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Chineke Bụ _______Ihe Atụ

God Is _______

ỤBỌCHỊ 2 NKE 6

Chineke Dị Obi Ebere

Ya mere, ka anyị jiri nkwụwa okwu bịa n’ocheeze nke Chineke anyị dị amara. N’ebe ahụ ka anyị ga-enweta ebere Ya, anyị ga-ahụkwa amara nke ga-enyere anyị aka mgbe ọ di anyị oke mkpa. Ndị Hibru 4:16 NLT

Dịka anyị kwụrụ ụnyaahụ, Chineke na-achụso anyị mgbe niile, ọbụlagọdi mgbe anyị n'erụghi erụ. Ma njirimara ahu bụ ezigbọte akara nke ebere Ya.

Anyị niile emehiewọ wee bụrụ ndi n'erụghi erụ n'anya Chineke, nke na-eweta ihe mgbochi n'etiti anyị na Chineke anyị zuru okè, dị nsọ. Ma site n’ebere Chineke, Ọ zitere Jizọs ka Ọ were ntarama ahụhụ kwesịrị anyị—ọnwụ—ma keekwara anyị ụzọ anyị ga-esi soro Ya nwee ndụ ebighị ebi.

Ya mere ebere Chineke pụtara na anyị anaghị enweta ntarama ahụhụ kwesiri anyị. Ma ọ kwụsịghi n'ebe ahụ. Ebere Chineke abụghị naanị inye anyị ụzọ mgbapụ. Ọ bụkwa maka Chineke iwanyewe Onwe Ya ohere n'ime ụzọ ahu. Ọ bụghị naanị na Ọ wepụrụ mmehie anyị, Ọ zitere Ọkpara Ya. Ọ mere ụzọ site n’izute anyị ebe anyị nọ, dịka otu anyị si wee diri.

Jizọs biara ka Imanụel: Bụ Chineke nke nọnyeere anyi. Ọ nwetara mmetụta niile nke n'emetụta umu mmadụ, ma ndụ Ọ biri n'elu uwa a bụkwa ihe àmà nke ọchịchọ Chineke ịbịaru anyị nso. Ma n'ime nso ahu, ka anyị na-ahụ ebere Chineke.

N'ime Oziọma nke Akwụkwọ Nsọ, anyị na-ahụ ọtụtụ ihe atụ nke ndị na-arịọ Jizọs ka Ọ "meere" ha ebere. Otu ihe omumatụ dị ike ka akọwara n'ime Luk 17 mgbe ụfọdụ ndị nwere ekpenta bịakwụtere Jizọs.

N'ikọwa ya ofuma, ekpenta n'oge ahụ mere ka ndị bu ya bụ oria bụrụ ndị ana adịghị emetụ aka bụrụkwa ndi achụpụrụ achụpụ. Dị ka iwu nke Levitikọs siri kwụọ, a na-ewere ha dị ka ndị na-adịghị ọcha, nke pụtara na onye ọ bụla metụrụ ha aka ga-aghọkwa onye na-adịghị ọcha.

Ma dị ka Chineke biara n'udidi mmadu, Jizọs dị ọcha. Ọ nweghị ntụpọ, Ọ dị nsọ ma zukwa okè. Ka ndị ekpenta ahu na-abịaru ya nso, ha nọ na-etiku maka ebere. Jizọs gwakwara ha ka ha gakwụrụ onye nchụàjà—dika usoro iwu si kwadọọ. Ma ka ha na-aga, ha niile nwetere ọgwụgwọ ha.

Jizọs mezuru iwu n'ụzọ dị iche. Kama ịbụ onye na-adịghị ọcha site n’imetụ ha aka, Ọ bufere ịdị nsọ nke Ya iji kpụchie adịghị ọcha ha.

Ma nke ahụ bụ akara zuru oke nke ihe Jizọs meere onye ọbụla n'ime anyị site na ọnwụ Ya na mbilite n'ọnwụ Ya. Chineke ewepụghị naani mmehie anyị, ihe mgbu anyi na obi mgbawa anyị—Ọ zutere anyị n’ime ihe ndia site n’aka Jizọs. Mgbe anyị nabatara nzọpụta n'ime Kraịst, anyị na-enwete ebere Chineke.

Ma ọzọkwa, ọ karịkwara nke ahụ. Anyị na-enweta ebere Chineke na-abụghị naanị site na nzọpụta azọpụtara anyị makwa anyi na-enwete ya n'ime oge mgbu, oge iru újú, na oge obi enweghi udo—dị nnọọ otu ndị ekpenta ahu si wee nweta. Ya mere na ọ bụrụ na ị nọ n'oge siri ike ugbu a, tikuo Chineke maka ebere Ya. Ọ nọnyeere gị. Ọ nọ nso. Nakwa Ọ nwere ikikere ịgwọ gi ọrịa, iweghachita ihe ndi fụnaara gi, na ịgbapụta gi.

Kpee ekpere: Chineke, ekelee m gị maka imere anyị ebere nke ukwuu. Daalụ maka Jizọs. Daalụ maka ịbụ Chineke nke chọrọ ịbịarụ anyị nso, n'agbanyeghị na anyị erughị eru maka ya. Nye m anya ka m hụ ebere Gị ọbụnadi n’etiti ihe mgbu, ma nyere m aka ka m gbasakwa ụdị ịhụnanya ebere ahụ nye ndị nọ m gburugburu. N’aha Jizọs, amen.

Ihe ịma aka: Chọọ ohere iji hụ ebere Chineke n'ime ndụ gị ma meere ndị ọzọ ebere taa.

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

God Is _______

Ònye ka Chineke bụ? Anyị niile nwere azịza dị iche iche, mana olee otu anyị ga esi mara nke bụ eziokwu? N'agbanyeghị ụdị ahụmahụ inwere ebe gị na Chineke, gi na Ndị Kraịst, ma ọ bụ gi na ndi ụka, oge erụwọ iji chọpụta Chineke maka Onye Ọ bụ n'ezie—n'íhé, ugbu a, na di njikere izụte gị kpọmkwem ebe ị nọ. Zọpụ ụkwụ nke mbụ n'ime Atụmatụ Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị isii na-esọ usoro ozi Ukọ Chukwu Craig Groeschel, Chineke bụ _______.

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/