Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

ABÙ ỌMA 18:1-32

ABÙ ỌMA 18:1-32 IGBOB

Anamahu Gi n'anya nke-uku, Jehova, bú ikem. Jehova bu nkumem di elu, na ebem ewusiri ike, na onye nēme ka mb͕apu; Ọ bu Chinekem, na oké nkumem, anamab͕abà nime Ya; Ọ bu ọtam, na mpi nke nzọputam, na ulo-elum. Onye anēto eto ka Ọ bu, anamakpọku Jehova: Ewe zọputam n'aka ndi-irom. Udọ̀ nile nke ọnwu b͕aram buruburu, Miri-iyi nile nke ihe jọb͕uru onwe-ya nēme kwa ka m'tua egwu. Udọ̀ nile nke ala-mọ dim buruburu: Ọnyà nile nke ọnwu biara n'irum. Anamakpọku Jehova nime nkpà kparam, Ọ bu Chinekem ka m'nētiku: O nēsi n'ulo uku Ya nu olum, Nkpu m'tikuru Ya we ba na nti-Ya abua. Ala we me nkpatu ma kwa jijiji, Ntọ-ala nile nke ugwu nile nāma kwa jijiji, Ewe me ka ha me nkpatu, n'ihi na iwe-Ya di ọku. Anwuru-ọku rigoro n'imi-Ya, Ọku nēsi kwa n'ọnu-Ya ripia: Afunwuru icheku site na ya. O rulata-kwa-ara elu-igwe, rida; Oké ọchichiri di kwa n'okpuru ukwu-Ya abua. O we nọkwasi n'elu cherub dika inyinya, we felie: O we fesie ike n'elu nkù ìfùfè. Ọ nēdo ọchichiri ka ọ buru ebe-nzuzo-Ya, ka ọ buru ulo-ntu-Ya nke di Ya buruburu; Bú ọchichiri miri, igwe-oji b͕ara ọchichiri nke mbara-ígwé. Site n'onwunwu nke nēnwu n'iru Ya igwe-oji-Ya nile nke b͕ara ochichiri gabigara, Akú-miri-ígwé na icheku ọku. Jehova we ma éb͕è-elu-igwe n'elu-igwe, Onye kachasi ihe nile elu nēme kwa ka olu-Ya da; Ákú-miri-ígwé na icheku ọku. O we b͕a àkú-Ya, me ka ha b͕asa; Ọtutu àmùmà kwa, O we chusa ha. Ewe hu ebe nile miri si erù, Anēkpughe kwa ntọ-ala nile nke elu-uwa dum madu bi, Site n'ibasi-nba-ike-Gi, Jehova, Site nume nke iku-ume nke imi-Gi. O si n'elu zìe, kurum, Dọputam n'ọtutu miri. Ọ nānaputam n'aka onye-irom di ike, Na n'aka ndi nākpọm asì, n'ihi na ha nwere ume karim. Ha nābia n'irum n'ubọchi nhuju-anyam: Ma Jehova burum ihe-ndabere. O we me ka m'puta rue ebe sara mbara; Ọ nādọputam, n'ihi na ihem tọrọ Ya utọ. Jehova nēnyeghachim dika ezi omumem si di; Dika idi-ọcha akam abua si di, otú a ka O nēmeghachim ọzọ. N'ihi na edebewom uzọ nile nke Jehova, Emebighikwa m iwu n'ipu n'aka Chinekem. N'ihi na ikpé-Ya nile di n'irum, Ukpuru-Ya kwa, adighm-ewezuga ha n'ebe m'nọ. M'we zue okè n'ebe Ọ nọ, Edebe-kwa-ram onwem pua n'ajo omumem. Jehova we meghachim dika ezi omumem si di, Dika idi-ọcha akam abua n'anya-Ya si di. N'ebe onye-ebere nọ I gēgosi Onwe-gi onye-ebere; N'ebe nwoke zuru okè nọ I gēgosi Onwe-gi onye zuru okè; N'ebe onye di ọcha nọ I gēgosi Onwe-gi onye di ọcha; Ma n'ebe onye b͕agọro ab͕agọ nọ I gēgosi Onwe-gi onye-nb͕á. N'ihi na Gi onwe-gi gāzọputa ndi ewedara n'ala; Ma anya npako, I gēme ka ha di ala. N'ihi na Gi onwe-gi gāmuye oriọnam: Jehova, bú Chinekem, nēme kwa ka ọchichirim nwue enwu. N'ihi na m'nēsite na Gi b͕a ọsọ ichu usu ndi nāpunara madu ihe; Anamesite kwa na Chinekem wubiga mb͕idi. Chineke, uzọ-Ya zuru okè: Okwu-ọnu Jehova bu ihe anuchara anucha; Ọta ka Ọ buru ndi nile nke nāb͕abà nime Ya. N'ihi na ònye bu Chineke, ma-ọbughi Jehova? Ònye bu kwa oké nkume, ma-ọbughi Chineke-ayi? Ọ bu Chineke Nke ji ike kem dika ihe-ọkiké, Ọ nēme kwa ka uzọm zue okè.