Uwe Ngwa Agha Nke ChinekeIhe Atụ
Anyi kọwaraokwukwejiri nghọta nke a di mfe: ikpa agwa dika Chineke Ọ na-ekwu ezi okwu.
Eziokwu bu ihe nkonye ihe niile gbasara ndu obibi jụpụtara n'okwukwe gbakwasiri. Oburu n'imaghi eziokwu, inwekataghi mara otu iga esi kpaa agwa na njikọ gi na ya. Ya mere na eziokwu nke omume Chineke na okwu Ya wetara mgbakwasi ukwu nke n'ekwe ka okwukwe anyi n'amabanye makwa n'eto.
Eziokwu nke Chineke bu ihe n'eme inwe okwukwe n'ime Chineke ka ọ baa ụrụ. Ewezuga eziokwu, anyi enweghi ihe siri ike anyi ga ekosa ọta okwukwe anyi na. Ya mere ima eziokwu nke Chineke na ima eziokwu banyere Chineke dika ekpughere n'okwu Ya di oke mkpa ma ọ buru na anyi chọrọ ibipụta okwukwe anyi n'uzo kwesiri ekwesi, ma nwete uru ndi di na idi nchebe site n'ọta anyi.
Ihe mkparita ụka obula gbasara okwukwe agaghi ezu oke oburu na arụtụghi aka ezigbote mkpa nke inụ olu Chineke nke oma na enweghi mgbagha. Oburu na anyị akpachapụghi anya, okwukwe nwere ike igbanwe buru nzuzu—elebaghi anya, echeghi echiche, makwa atụghi uche na ihe nwere ike igbu mmadu, agwa akpara n'aha okwukwe. Mana ezigbo okwukwe ga adiriri nke arụrụ gbadọsie ike na ntọala Okwu Chineke nke edere ede ka Mmụọ Ya n'edu gi ka itinye ya n'ọrụ na ndu gi.
Elee otu iga esi kọwaa ọdiiche di n'okwukwe na nzuzu? Elee ihe n'ejide mmadu ka ọ ghara igafe oke di na etiti ha abuo? Dika ndi kwere ekwe, anyi nwere ohere pụrụ iche ima ntuziaka Ya banyere anyi ka anyi n'achọ ya site n'ekpere. Ọ ga adi ntụkwasị obi igọsi anyi eziokwu, inye anyi ntuziaka Ya banyere nzọmụkwụ ozo anyi kwesiri ime. N'eziokwu, idi obi sie ike na ikwu chim n'ime nzọmụkwụ ozo nke ahu di oke mkpa inwe ike inyere anyi aka inọ n'enweghi nkwagharị ka anyi chụọ uzo ibi ndu echebere site na ọta nke okwukwe.
Ozigbọ imaara nke oma eziokwu nke Chineke ma obu nkwenkwa nke Chineke banyere ihe, oge erụwọ iga n'ihu n'uzo ọ dabaara ya na ya. Gee ntị nke oma—mmetụta gi enweghi ike ibu ihe nkabi ikpe azu banyere omume gi. Mmetụta n'agbanwe ma di n'okpuru ihe mkpali ezi. Omume ndi emere n'okwukwe kwesiri idi nnọgidesi ike n'ime ihe di ezigbo ọkpụrụkpụ ma kwụrụ chim. Chineke anyi di eziokwu ma di ụrụ ọsụsọ. Ọ no ya mgbe niile—kamie Ekwensu n'ike—inụ ekpere anyi jụpụtere na nsogbu, ikweaghachi nkwa Ya di atụghi ujọ, ma inye mkpa ọkụ ozo anyi chọrọ maka iji gaa n'ụsọrọ n'ụsọrọ n'ime ntuziaka Ya.
Welie nụ ọta unu, ndi agha. Anyi n'aga ije site n'okwukwe.
Maka ihe ndi ozo banyere omumu a, makwa nkuzi ihe ọnyọnyọ nke ọdee Priscilla Shirer, gaa na lifeway.com/armorofgod.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kwa ụbọchị, agha a na-adịghị ahụ anya na-ada gburugburu gị— nke ana-ahụghị, nke ana-anụbeghị, ma nwee mmetụta ná ndụ gị nile. Onye iro raara onwe ya nye, nke ekwensu, na-achọ ibibi ihe niile dị gị mkpa: obi gị, uche gị, alụmdi na nwunye gị, ụmụ gị, nrọ gị, akara aka gị. Atụmatụ agha ya dabere na ijide gị mgbe ina amaghị ama na mgbe ina enweghị ngwa agha. Ọ bụrụ na ike nkwagharị ma njide n'adighi njikere agwụla gi, ọmụmụ ihe a bụ maka gị.
More