Uwe Ngwa Agha Nke ChinekeIhe Atụ
Ịbụ onye kwere ekwe anaghị enye gị ihe mgbochi site na mbuso agha nke ndị iro, mana ọ na-enye gị ohere ịnweta ike nke Nna—ike Ya ichekwa gị ya na ịtụgharị ihe emere gị. Ọ bụrụ na ịchọrọ imeri n'ọgụ a—ọ bụrụ na ịchọrọ isonyere m n'ịtụgharị edemede a, ịkwatu onye iro, na merụọ mmetụta ya na ndụ gị - isi ihe bụ ịghọta na ịnwere njikọ ike ahu nke ime mmụọ karịa ihe na-abịa megide gị.
Pọl dere Ndị Efesọs n'abụghị nanị ịdọrọ uche gaa n’agha ime mmụọ nke dị n’ebe a na-adịghị ahụ anya, n'uwa a na-adịghị ahụ anya, kama ọ bu maka nzube nke ikpughe ike dị n’ime onye ọ bụla nke ya na Chineke na-enwe mmekọrịta site na Kraịst. N’ime Ndị Efesọs, Pọl rụtụrụ aka n’otu ihe kachasi mkpa, bu ihe a na eleghara anya n'ime ihe ngwa agha nke ime mmụọ anyị: ekpere.Pọl lere ekpere anya dị ka ihe dị oké mkpa n’inweta mmeri gafee ike ekwensu ná ndụ anyị, dị ka otu ọkà mmụta kwuru, “Ndị Efesọs nwere nhata kariri pasenti iri ise n'ise n’amaokwu ndị metụtara ekpere kpọmkwem” dị ka ndị Rom, bụ́ akwụkwọ ozi Pọl kasị ogologo. Ọ gbawapụtara n'ekpere ọtụtụ ugboro ka ọ na-ede ihe. Ma mgbe ọ kpere ekpere … nwanne, ọ na-eji usoro, n'agwa ndị na-agụ ya kpọmkwem ihe ọ na-ekpe ekpere maka ya. Ọ maara na ekpere nwere ike ịgbanwe ọnọdụ nke ndụ ha dum. Mmeri n'agha ime mmụọ enweghị ikewapụ ya na ekpere.
Gụọ Ndị Efesọs 1:18-21 na 3:14-19 . N'ime ihe niile Pọl kpere, olee nke ichọrọ kacha mkpa ka ị rịọ Chineke ubọchi taa?
Orụ akpọpụtara
1. James E. Rosscup, “Mkpa ekpere n’ime Ndị Efesọs,”Akwụkwọ akụkọ nke Nna Ukwu Seminarị, Mpịakọta nke isii, Nọmba nke Mbu (Spring 1995), 58.
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kwa ụbọchị, agha a na-adịghị ahụ anya na-ada gburugburu gị— nke ana-ahụghị, nke ana-anụbeghị, ma nwee mmetụta ná ndụ gị nile. Onye iro raara onwe ya nye, nke ekwensu, na-achọ ibibi ihe niile dị gị mkpa: obi gị, uche gị, alụmdi na nwunye gị, ụmụ gị, nrọ gị, akara aka gị. Atụmatụ agha ya dabere na ijide gị mgbe ina amaghị ama na mgbe ina enweghị ngwa agha. Ọ bụrụ na ike nkwagharị ma njide n'adighi njikere agwụla gi, ọmụmụ ihe a bụ maka gị.
More