Uwe Ngwa Agha Nke ChinekeIhe Atụ
Onye agha Rọm “kechiri úkwù ya” jiri ihe di ka nke n'úkwù karia eriri. (Nke bu ezigbo ihe nwoke, amaara m.) Otutu oka mmụta kwetara na karia ihe efe obula ma obu akụrụngwa onye agha nwere, ihe nke n'úkwù a—ya na ihe ndi ejiri chọọ ya nma na ntuchi ya pụrụ ìhè—mere ka onye agha di iche n'ebe mmadu nkiti nọ. Ọ bughi ihe achọrọ ma achọghi, ihe ndọzi nke nsọte, dika nke udi nke mụ ma obu gi nwere ike itinye n'ihe ana eyi eyi. Ọ bu ihe akwadọrọ akwadọ, ihe mbu di mkpa na ọjiji onye agha. Chee maka ihe nke n'úkwù ndi ahu sara mbara ndi ọrụ UPS® na FedEx® n'eyi n'úkwù ha mgbe ha n'apa ihe ndi di arụ. Osimike, leda nke n'úkwù nke onye agha ndi Rọm bu nke emere ka ọgbazụọ ukwu ya ma nye ya nkwadọ di mkpa mgbe ọ na eme mmeghari nke agha nke di ọsịịsọ ma nke a chọrọ ka ọ mee.
Eziokwu bu nkwadọ gi. Ọ na enye nkwụgide bara uru ị chọrọ mgbe ị nọ n'etiti agha nke ime mmụọ.
Cheta, ihe onye iro kacha ji rụọ ọrụ bu aghụghọ. Ọ na ezọ ihe pụtara ìhè jiri agba nke n'ado akpiri na nke n'arata, n'arafu anyi n'ebe ụkpụrụ ndi di oji na ocha. Ọ na ekesa ihe ndi nrụrọ efu, n'eme ka ihe ndi n'anaghi adigide na ihe ndi n'abaghi uru ka ha pụta dika ha bara nnukwu uru ma buru okacha nma. Nkechi ya di nnọọ oke amamighe nke pụtara na ọ buru na anyị amaghi nke bu eziokwu—a na m ekwu imara ya n'ezie, mara ya n'ime ime anyi—ọdi mfe anyi ima n'onya n'ime atumatu ya.
Eziokwu—nke anyi nwere ike ikọwa dika echiche Chineke gbasara ihe obula—bu ihe ọmụmatụ anyi. Eziokwu bu onye Chineke bu ma burukwa ihe Ọ si n'obu, nke achikọọrọ anyi onu n'ebe kachasi nma n'ime Mmadu nke Jizọs Kraịsti.
Eziokwu Chineke. Eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ. Ejighi nrụwe isi siri ike na nkwenye sọrọ eziokwu a—sọgide eziokwu bu ezie—iga adi enweghi ume ma buru onye enwere ike irafu site na ihe ndi yiri ka ha bu eziokwu na n'ada ka ha bu eziokwu mana n'ezie ha abughi eziokwu. Mana jiri ọmụmatụ eziokwu nke nọ, ị nwere ike itụghari ihe niile obula n'ime ndu gi—ọchichọ gi, nhọrọ gi, na metụta gi; obi gi, uche, na metụta obi—rụọ mgbe ha niile kwụụrụ ofuma. Mgbe ị nwere ime ime siri ike, kwugidesiri ike, nke akwadọrọ ofuma, igaghi adi mfe idufu site na asi onye iro kpachapụrụ anya wee tụọ. Jiri eziokwu kee onwe gi aji n'ume, ma gi aburu onye di njikere mgbe asi “gawa.”
Onwunwa nke ezie ga-abia mgbe ntunanya na okà ihe omuma nke omenaala anyi ga-efega n'uzo di iche, ma kama anyi ahọrọ ikwusi ike ma jigidesie ike na ọmụmatụ Chineke nke n'adighi agbanwe agbanwe. Oge abiala ka anyi buru ndi umu nwaanyi ji eziokwu kee onwe ha aji n'ume.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kwa ụbọchị, agha a na-adịghị ahụ anya na-ada gburugburu gị— nke ana-ahụghị, nke ana-anụbeghị, ma nwee mmetụta ná ndụ gị nile. Onye iro raara onwe ya nye, nke ekwensu, na-achọ ibibi ihe niile dị gị mkpa: obi gị, uche gị, alụmdi na nwunye gị, ụmụ gị, nrọ gị, akara aka gị. Atụmatụ agha ya dabere na ijide gị mgbe ina amaghị ama na mgbe ina enweghị ngwa agha. Ọ bụrụ na ike nkwagharị ma njide n'adighi njikere agwụla gi, ọmụmụ ihe a bụ maka gị.
More