Uwe Ngwa Agha Nke ChinekeIhe Atụ
N'ime akụkọ nke gara aga maka alụm ogu, otu n'ime ụzọ ndi esi alụ ogu nke emere maka itinye nnukwu ogbaghara bu nke ime nlụsọ agha ana atughi anya jiri ụta nke n'enwu ezigbote ọkụ. Ụta ndi a, amunyere ọkụ n'odu ha, ga efe n'ikụkụ gawa ebe ezigara ha (ihe ọmụmatụ dika, ụgbọala kwaaji na ụlọ ikwụụ nke ebe obibi ndi agha), munye ihe niile ọkụ.
Ma, nwanne, ọdi irè. Oburu na otutu ụta ndi ahu kụsụrụ otutu ihe ndi ezigara ha ka ha kụsụọ, ndi agha niile ga adi n'ọrụ na-agbaghari imenyu ọkụ n'enwu ka ọghara igbacha ngwa ha na ngwongwo ha niile ọkụ. Ka ọkụ n'enwu meghariri ha anya, ndi agha aburu ndi n'adighi ike site n'etinyeghi uche, emeghariri oke anya ka ha ghara imegide ogu obula n'esọte nke onye iro ha n'abia n'akpụ.
Ụta ndi n'enwu ọkụ abughi ihe mbu emere ka ha gbụọ ma obu bibie; emere ha ka ha megharia anya.
Onye iro gi chọrọ imeghari gi anya, nwanne m nwaanyi. Ka ọ were nwee ike iru gi ala. Ma gee mụ nti—ọ naghi agbakasi ụta ndi ya ahu n'enwu ọkụ n'efu. Ọ maara ihe ọ n'eme n'ezie. Ọ mụọla otu isi eme ihe na usoro isi eme ihe, ujọ gi ndi di ime ime na ume ngwu gi niile, ma ya n'agba ebe ndi ahu niile ụta. Ọ maara na ọ nweghi ike ibibi gi. Idi mkpụchi siri ike n'ime Jizọs. Mana ọ chọrọ n'ezie ka ọ wepu uche gi site n'imunye otutu ọkụ obula n'ime ndu gi—dika enweghi nchebe, iyi egwu, obi ezughi oke, echiche, ma obu oke iru ọrụ. Ọ chọrọ ka ighara ima ihe ina eme ma ya esi n'azu n'arikwụte gi.
N'ime Ndi Efesọs Isi Nke Isii, Pọl kwụrụ maka eriri eji ekedo uwe n'ukwu, ngwa nchekwa nke obi, na akpụkpọ ukwu dika uwe ime mmụọ ndi kwere ekwe kwesiri iyi mgbe niile. Nkeji na nkeji. Ubochi kwa ubochi. Mana a bia n'ebe ọta nke okwukwe nọ, ọ nyere iwu ka e “welita ya elu.”
Lee ya anya n'uzo a: onye nọọsụ nwere ike iyi efe ọrụ ya kwa ubochi iji ya rụọ ọru maka n'obu efe ọrụ ya. Mana mgbe ọ di mkpa, ọ ga atụtụrụ stetọskọpụ ya, ngwa oji achọpụta obara mgbali elu, ma obu ngwa ọnụ ọgụ obula ọ chọrọ iji gwọọ onye oria ya. Otu ahu, anyi kwesiri mgbe niile iyi kwa ubochi, uwe si n'chi enyewọọrọ anyi, ma di kwa njikere “iwelite elu” ndi ozo mgbe a chọrọ ha.
Nke mbu n'ime ngwa agha ndia bu ọta nke okwukwe. Ozugbọ mbu anyi nwere mmetuta maka ụta n'enwu ọkụ ribatara n'ndu anyi n'uzo di aña, anyi ewelie okwukwe dika ọta nke nchebe n'elu ndu anyi.
Elefekwala ihe dika ọbu asi ma bụrụ eziokwu ebe a. Onye iro n'eziga ụta n'enwu ọkụ n'ime ndu gi kpọmkwem mgbe a kpọrọ gi ka i gaa ije n'okwukwe. Ama ama mee ụta ndi ahu ka ha gbọchie gi ka ighara ime naani otu ihe nwere ike imenyu ha: iga ije n'okwukwe! Okwukwe n'eme ka ụta n'enwu ọkụ nyọ.
Gini ka Chineke n'asi gi ka ime? Mee ya! N'okwukwe.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Kwa ụbọchị, agha a na-adịghị ahụ anya na-ada gburugburu gị— nke ana-ahụghị, nke ana-anụbeghị, ma nwee mmetụta ná ndụ gị nile. Onye iro raara onwe ya nye, nke ekwensu, na-achọ ibibi ihe niile dị gị mkpa: obi gị, uche gị, alụmdi na nwunye gị, ụmụ gị, nrọ gị, akara aka gị. Atụmatụ agha ya dabere na ijide gị mgbe ina amaghị ama na mgbe ina enweghị ngwa agha. Ọ bụrụ na ike nkwagharị ma njide n'adighi njikere agwụla gi, ọmụmụ ihe a bụ maka gị.
More