Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka LentiIhe Atụ
Omume Ndi Nke Ime Mmụọ: Okwu Nkpachara Anya
Tụpụ Jizọs amalite ọzi ihu ọha Ya, Ọ ji obi Ya gaa n'ala ịkpa rụọ ụbọchị iri anọ ka ọ nọrọ naanị Ya. Oge a kwadebere Ya igụzọgide ọnwụnwa niile ekwensu tụbara Ya ma Ya wee bata n'ime ọkpụkpọ ọku Chineke kpọrọ Ya. Ịmepụta ezi àgwà ime mmụọ pụrụ inyere anyị aka ime otu ihe ahụ.
Ka ị na-aga n'ihu na-abịaru Chineke nso kwa ụbọchị site na Lenti, ihe ị na-eme n'oge a ga-amalite ịghọ ma soro na ihe ndi di gi mfe ime kwa ụbọchị na kwa izu.
Ka ha di mfe ime otu a, ị ga-amalite ịhụ na ndụ gị dị iche n'ihi na ị na-eme ha. Ị na-eke ohere ka Chineke gbanwee obi gị ka e wee si n'aka gị gọsi otuto Ya nye ụwa ike gwụrụ nke n'achọ olileanya na Onye Nzọpụta.
Ma mgbe ị na-eme ihe ndị a, buru n'uche na àgwà ime mmụọ n'onwe ha abụghị ebe njedebe. Ebumnobi bụ ka anyị na Chineke nwee mmekọrịta miri emi. Okwu Chineke mere ka ọ dọọ anya na nrụbeisi dị mma karịa ịchụ àjà. Nke a pụtara na mgbe anyi chụrụ ihe ọbụla di ka àjà, ọ kwesịrị ịbụ site n’ebe umeala obi nke nyefe onwe—na-abụghị site n’echiche nke irụ ọrụ n'ejighi obi zuru oke. N’otu aka ahụ, àgwà ime mmụọ na-agbakwụnye uru mgbe ha gọsipụtara nrụbeisi nke dabere n’ịhụnanya Chineke.
Ya mere ka ị na-akwado maka Sọnde Mbilite N’Ọnwụ, chetara onwe gị na Chineke anaghị atụ anya ka ị too n’ụzọ ime mmụọ n’onwe gị. Nye onwe gị ikike ịbịa n’ihu Ya n’ezughị okè gi, n’ihi na ọ bụ ike Chineke ka e mere ka ọ zuo oke n'ime adịghị ike gị.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Lenti: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lenti dị ka n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwere ike ịmalite ime n'oge Lenti iji nyere onwe gị aka ịkwadọ obi gị maka Sunday Mbilite N'ọnwụ—na ubọchi ndi ọzọ n'esotekwe.
More