Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka LentiIhe Atụ

Make Space for What Matters: 5 Spiritual Habits for Lent

ỤBỌCHỊ 4 NKE 7

Omume Ndi Nke Ime Mmụọ: Imesapụ Aka

Gịnị bụ ihe inwere kacha dị oke ọnụ ahịa? Ọ nwere ike ịbụ ihe kacha baa uru ị nwere, dị ka ụlọ ị rụworo ọrụ ndụ gị niile iji nweta. Mana ọ nwekwara ike ịbụ fọtọ sitere na oge pụrụ iche gị na onye ị hụrụ n'anya nọrọ. Ma ọbụ ọ nwere ike ịbụ onyinye bara uru sitere n'aka enyi gi.

Uru anyị na-ekenye “ihe” ndi anyị nwere di ngwakọta ya na mmetụta uche anyị. Otú anyị si ahọrọ iji ihe ndị anyị ji kpọrọ ihe eme ihe na-egọsipụta ihe ndị anyị na-ebute ụzọ di ka ezi ihe n'uche anyi.

Ọnwụ Jizọs n’elu obe bụ otu n’ime ihe atụ kacha mma nke mmesapụ aka Chineke. N’agbanyeghị imara na anyị apụghị ịkwụghachi Ya ụgwọ, Chineke egbughị oge inyefe akụ ya kasị ukwuu—Ọkpara nke naanị Ya—maka anyị. Sitekwa n’omume ịchụ-aja ahụ, Ọ gọsipụtara ihe mmesapụ aka yiri: iji obi anyị na-enye ihe anyị nwere ka onye ọzọ wee nwee ọganihu, ọbụnagodị na ọ na-akpatara anyị mgbu ka anyi n'eme ya.

Ịkwesighi inye naanị ego ka ị na-emesapụ aka. Ibi ndụ mmesapu aka bụ ikweta na Chineke nwere ike ime ihe ọ bụla Ọ chọrọ site n'onyinye ndị Ọ nyere anyị. Mgbe ị kwere ka Chineke na-enye site n'aka gị, ma gị na-asọpụrụ Ya site n'ihe ndị ị na-enye, ọ na-adọta gị nso na Ya. Mmesapụ aka na-esi n'obi ekele na ntụkwasị obi pụta, ma mgbe ị jiri ihe ị nwere tụkwasi Chineke obi, Ọ ga-amalite inye gị karịa ka ị nwere.

Ịme omume a ga-echetara gị na ọ bụghị gị na-achịkwa, ma ị maara Onye na-achịkwa—na Ọ nwere ikike igboro gị mkpa gị niile.

Mee Ihe: Otu n’ime ọrụ ebube ndị ama ama Jizọs rụrụ bụ ime ka ogbe achịcha na azụ̀ ole na ole mmadụ nwere inye mụbasiara ọha. Kedu ihe ị nwere i ga-enye? Gbalịa ịchọta ebe ị nwere ike itinye ihe ị nwere n'ụzọ ụfọdụ. Malite obere, ma ọ bụ mee nnukwu. Naanị bido.

Ụbọchị 3Ụbọchị 5

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Make Space for What Matters: 5 Spiritual Habits for Lent

Lenti: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lenti dị ka n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwere ike ịmalite ime n'oge Lenti iji nyere onwe gị aka ịkwadọ obi gị maka Sunday Mbilite N'ọnwụ—na ubọchi ndi ọzọ n'esotekwe.

More

Ọ bụ YouVersion mepụtara ma nye atụmatụ mbụ nke Akwụkwọ Nsọ a.