Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka LentiIhe Atụ

Make Space for What Matters: 5 Spiritual Habits for Lent

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Gịnị Kpatara Eji Eme Lenti?

Kwụsịtụ ntakịrị ma lepụ anya n'èzí. Kedu ihe ị na-ahụ? Kedu ihe na-eme gị ọnụ ọchị?

Ihe ọ bụla ị kọwapụtara ugbu a, chee echiche banyere nke a: ihe ị hụrụ nọ ebe ahu mgbe niile—ọ na-eche naanị ka ị kwụsịtụ ma hụ ya.

Nke ahụ bụ ebumnuche isi nke Lenti: imepụta oghere n'etiti ọrụ ndụ iji ghọta ihe dị mgbe niile—ọnụnọ Chineke.

Lenti bụ ụbọchị iri anọ na-edubanye na Sọnde Mbilite N'Ọnwụ. Gbakwasi ukwu na ụbọchị iri anọ Jizọs nọrọ n’ime ọzara, Lenti bụ ngwá ọrụ ga-enyere gị aka ịmatakwu olu Chineke na ịhụnanya ịchụ-aja Ya. Ọ bụ eziokwu na akpọghị Lenti aha n'ezie n'ime Akwụkwọ Nsọ, ma a tụlere maka ya na Nzụkọ nke Nicea n'afo 325 AD n'ihi na ọ nyere echiche nke ntụgharị uche na nchegharị maka Ndị Kraịst ka ha na-abanye n'oge ọpụpụ ihe ubi—oge a maara ofuma bụ maka mmalite ihe ọhụrụ.

Ebumnobi nke Lenti abụghị iji “mezie” ndụ gị, kama ọ bụ igbakwasi ndụ gị n'ihe kachasị mkpa: Onye kere gị ma nwụọ maka gị. Otu n'ime ụzọ ị si eme nke a bụ site n'ime omume ndi nke ime mmụọ.

Ya mere ka ị na-akwado maka Sọnde Mbilite N’Onwụ, ka anyị nyochaa ụfọdụ omume ndi nke ime mmụọ ị nwere ike na-eme n’oge a, ma mee ha ihe ndi soro n'ihe nke ndụ gị kwa ụbọchị n’afọ ndị na-abịa abịa.

Mu na gi, ka anyị wepụta ohere maka ihe dị mkpa.

Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Make Space for What Matters: 5 Spiritual Habits for Lent

Lenti: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lenti dị ka n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwere ike ịmalite ime n'oge Lenti iji nyere onwe gị aka ịkwadọ obi gị maka Sunday Mbilite N'ọnwụ—na ubọchi ndi ọzọ n'esotekwe.

More

Ọ bụ YouVersion mepụtara ma nye atụmatụ mbụ nke Akwụkwọ Nsọ a.