Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka LentiIhe Atụ
Omume Ndi Nke Ime Mmụọ: Inọ Jụụ
Were ya na ị gụzọ n'elu ugwu naanị gị. Iyi na-aga nwaayọọ nwayọọ n'akụkụ gị ma ụmụ nnụnụ ana-agụ egwụ n'obi ụtọ ka ha n'efeghari n'elu gị. Anyanwụ n'acha nke ọma n'ihu gị ma ikuku dị nnọọ nma ana-efefe. Ihe niile dị jụụ makwa ha enweghi mkpọtụ—mana uche gị di ogbaghara ka ị na-eche maka ọrụ ndi ị na arụbeghi, nsogbu ndị ị na-enweghị ike idozi, na ihe ndi mebisiri emebi nke ị na-enweghị ike idozi. N'agbanyeghị na ịnọ n'ebe dị jụụ, ụda echiche nke onwe gị na-egbochi gị ịnụ ụtọ ihe na-eme gburugburu gị.
Gịnị ka ọ ga-ewe gị ka ị kwụsịtụ, mechie mkpọtụ ahụ, ma nọrọ jụụ?
Site na ịnọ jụụ, anyị na-amụta ịṅa ntị n'ihe Chineke na-eme n'ime anyị na gburugburu anyị. Mana ịnọ jụụ nwere nke ime ihe na nke ana-adighi eme ihe. Ọ na-agụnye ikwe ka Chineke tụgharịa nlekwasị anya nke ọhụụ anyị ma mee ka anyi gee ntị n’olu Ya ma anyị enye Ya mkpọtụ di n’ime anyị. Ọ gụnyere inyefe nchegbu anyi, obi ezughi Ike anyi, na nsogbu anyị n'aka Chineke ma anyi ekwe ka Ọ tụgharia obi anyị tụkwasi na Ya.
Dị ka anyị na-eme omume ime mmụọ a, anyị na-adịwanye njikere inye Chineke otuto maka ike Ya na-arụ ọrụ na ndụ anyị n'ihi na anyị na-amalite ịhụ ihe Chineke di na-eme na ndụ anyị.
Nzọmụkwụ Nke Ihe Aga Eme Eme: Si n'ebe inọ pụọ awa ole na ole n'izu a ma na-eme inyefe Chineke ihe ndọkasi ọ bụla na-abata gi n'uche. Ọ dị mma ma ọ bụrụ na ị ga-eme nke a ugboro ugboro rụọ nwa oge. Naanị jiri oge a mechie mkpọtụ dị n'ime gị ma banye n'omume ịme ohere iji nụ olu Chineke.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Lenti: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lenti dị ka n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwere ike ịmalite ime n'oge Lenti iji nyere onwe gị aka ịkwadọ obi gị maka Sunday Mbilite N'ọnwụ—na ubọchi ndi ọzọ n'esotekwe.
More