Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka LentiIhe Atụ

Make Space for What Matters: 5 Spiritual Habits for Lent

ỤBỌCHỊ 2 NKE 7

Omume Ndi Nke Ime Mmụọ: Ekpere

Ọ̀ dị ihe na-egbochi gị ịgwa Chineke okwu mgbe niile?

Ekpere n'ikowa ya n'uzo di mfe pụtara ịgwa Chineke okwu, na ige Ya ntị mgbe i kpesiri. Ma n’ihi na Jizọs kwuru ọtụtụ oge si, “Mgbe ị na-ekpe ekpere…,” anyị maara na Ọ na-atụkwa anya ka anyị na-ekpe ekpere.

Ịnwe ntụsara ahụ́ ikpe ekpere ga-adi gi mfe inwe mgbe ị kpere ekpere ugboro ugboro, mana nke ahụ ekwesighị igbochi gị iji obi siri ike na-achụso mmekọrịta gi na Ya.

Chineke na-eche mgbe niile ịbịaru gị nso, ọ nweghịkwa ihe ị ga-agwa Ya nke ga-egbochi Ya ịhụ gị n'anya.

Lenti bụ oge dị mma ịmalite ime ekpere ka ọ bụrụ àgwà gị kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na ị na-agbalị ịhazi ndụ gị gburugburu Chineke mana ị naghị ewepụta oge ka gị na Ya kparịta ụka, ọ gaghị ekwe omume idobe ndụ gị n'ebe Chineke nọ.

Ọ dị mfe itolite n’ụzọ ime mmụọ mgbe ị na-agwa Chineke eziokwu banyere uto gị. Ma mgbe ị na-agwa Chineke otú ị na-eme, ọ ga-amalite ichetara gị na Chineke nọnyeere gị n’ezie, nakwa na ọ na-atọ Ya ụtọ ịnọnyere gị. Ya mere ubochi taa, wepụta oge ka gị na Chineke kparịta ụka jụpụtara n'eziokwu.

Mee Ihe: Ọ bụrụ na ị maghị ihe ị ga-ekpe ekpere gbasara ya, gbalịa kpee ekpere site n’Ekpere Nke Onye-nwe-anyị ma mee ya ka ọ bụrụ nke gị.

Nna Anyị nke bi n’eluigwe,

ka edobe aha Gị nsọ.

Ka Alaeze Gi bia n'oge n'adighi anya.

Ka e mee uche Gi n'uwa,

di ka ọ di n'eluigwe.

Nye anyi ubọchi taa nri anyi chọrọ,

ma gbahara anyi mmehie anyi,

di ka anyi gbahawọrọ ndi

n'emehie anyi.

Ma ekwela ka anyị kwenye n’ọnwụnwa,

ma napụta anyi n'aka onye iro.

Matiu 6:9-13 NLT

Ụbọchị 1Ụbọchị 3

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Make Space for What Matters: 5 Spiritual Habits for Lent

Lenti: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lenti dị ka n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwere ike ịmalite ime n'oge Lenti iji nyere onwe gị aka ịkwadọ obi gị maka Sunday Mbilite N'ọnwụ—na ubọchi ndi ọzọ n'esotekwe.

More

Ọ bụ YouVersion mepụtara ma nye atụmatụ mbụ nke Akwụkwọ Nsọ a.