Mee Ohere Maka Ihe Di Mkpa: Ihe Ise Ihe Ọmụme Ndi Nke Ime Mmụọ Maka LentiIhe Atụ
Ihe Omume Ndi Nke Ime Mmụọ: Ibu Ọnụ
Mgbe ị na-eche maka “ibu ọnụ,” gịnị na-abata gi n’uche?
Eleghị anya, ị na-ahụ n'anya ime uche gi ka ndị mmadụ ji aka ha na-agụ onwe ha agụụ. Eleghị anya, ị na-ahụ ka otu onye mọnkụ ji achịcha kpọrọ nkụ di ka nri ya. Ma ọ bụ ikekwe ị bụ onye na-achọghi chaa chaa iche maka ibu ọnụ … ugbu a ma ọ bụ n'oge di n'ihu.
Jizọs nọrọ ụbọchị iri anọ n’ime ọzara na-ebu ọnụ. Ma n'ile anya na mkparịta ụka Ya na ndị na-eso ụzọ Ya nwere, ibu ọnụ bụ omume Ọ chere na ha ga-emekwa.
Ma ina-ama ụma na-eke ohere na ndụ anyị ka anyị nụ Chineke site n’iwepụ ihe ndị na-enye anyị afọ ojuju ozugbo nwere ike ime ka ahu ghara iru anyi ala—karịsịa mgbe ụwa anyị na-eto ihe ụtọ.
Ihe a bụ ihe atọ mere ibu ọnụ ji dị mkpa:
Ibu ọnụ na-akwusi agụụ ihe ahu na-egbochi anyị ịnwe mmetuta ọnụnọ Chineke. Ọ na-amanye anyị ịṅa ntị na ihe ndi nke ndụ anyị nke anyị na-agbalị imikpu site n'ihe ndi ụtọ ndi ahu anyi n'eme site n'abalị rụọ ututu na ina enyọ anya oge niile n'ihe ndi ahu eji agbasa ọzi juru eju. Ma n’ime usoro a, ọ na-akụziri anyị ka anyị dabere na Jizọs iji gbọọ mkpa anyị.
Ibu ọnụ na-akpọ anyị ka anyị hapụ ihe anyị hụrụ n’anya ka anyị nwee ohere maka ihe anyị hụrụ n’anya karịa. Ọ bụ ezie na ịhapụ ihe ị hụrụ n'anya, dị ka nri, nwere ike ịdị na-esiri gị ike ma mee ka ahụ ghara iru gi ala, ọ bụ n'ezie ohere ịnweta ọṅụ dị ukwuu, n'ihi na anyi n'enwete ezi ọṅụ naanị mgbe ike anyị sitere n'aka Jizọs.
A na ebụkari ọnụ tụpụ ihe ịrịbama emee. Mozis buru ọnụ ụbọchị iri anọ mgbe ọ na-anata Iwu iri ahụ, Daniel buru ọnụ izu atọ wee nweta ọhụụ, ma Jizọs buru ọnụ ụbọchị iri anọ wee merie ọnwụnwa nke ekwensu. N'ime atụ ndi a, Chineke nyere nghọta, ike, na ọganihu n'ebe ngafe nke ọzọ ahu achụrụ àjà nke nkwesi itụkwasị obi.
Mee Ihe: Gbalịa mechaa ibu ọnụ nke elekere iri abuo na anọ. Ọ bụrụ na ị naghị ebu ọnụ kwa mgbe, mee ibu ọnụ a n'ụzọ dị mfe—ihe ebu n'uche maka ibu ọnụ a bụ ka ị mesia ya. Ọ bụrụ na ị malite inwe ike ọgwụgwụ n’oge ibu ọnụ gị, gbanwee ike ọgwụgwụ ahụ ka ọ bụrụ ohere ịgwa Chineke okwu na ige Ya ntị. Ozugbo i mechara ibu ọnụ gi, detụọ ihe ọ bụla pụtara ìhè nye gị n'oge ibu ọnụ gi a.
Okwu Chukwu
Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Lenti: oge ntụghari uche na nchegharị nke ụbọchị iri anọ. Ọ bụ echiche mara mma, mana gịnị ka ime Lenti dị ka n'ezie? N'ime ụbọchị asaa na-esote, chọpụta àgwà ime mmụọ ise ị nwere ike ịmalite ime n'oge Lenti iji nyere onwe gị aka ịkwadọ obi gị maka Sunday Mbilite N'ọnwụ—na ubọchi ndi ọzọ n'esotekwe.
More