Udo Funahụrụ EfunahụIhe Atụ
Udo N'Ọgbaaghara
Ọ ga-ekwe omume inwe udo ọbụlagodi mgbe ị nọ n'etiti ihe na-agbawa obi? Azịza dị mkpirikpi bụ ee, mana nke ahụ anaghị eme ka usoro ahụ ghara ịdị ufu ma ọ bụ obere. N'ikwu eziokwu, ị nwere ike ịna enwe ahụmahụ udo na ihe mgbu n'otu oge.
Ndị na-eso ụzọ Jizọs na ndị sowere ụzọ Jizọs n’oge mbụ maara nke a n’onwe ha. Ha abụghị ndị ọhụrụ n'igabiga oké ifufe. Ma ọ bụ ezie na ha nọgidere na-ekwesị ntụkwasị obi mgbe nile, nke ahụ apụtaghị na ọ dịghị mgbe ha n'enweghị oke iwe maka ihe adịghị aga nke ọma, mgbagwoju anya, obi abụọ, ma ọ bụ nchegbu. Legodị anya n'ihe Pọl dere banyere ahụmahụ ya:
Anyị achọghị ka unu ghara ịma, ụmụnna anyị na ụmụnne anyị, banyere nsogbu ndị anyị nwetara n’ógbè Eshia. Anyị nọ ná nrụgide dị ukwuu, karịa ike anyị ịtachi obi, nke mere na ike ịdị ndụ gwuru anyị. N’ezie, ọ dị anyị ka a mara anyị ikpe ọnwụ. Ma nke a mere ka anyị ghara ịdabere na onwe anyị kama dabere na Chineke, bụ onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ bilite. 2 Ndị Kọrint 1:8-9 NIV
Pọl achọghị ikpuchi ahụmahụ ha. Ọ chọghị ka ndị mmadụ chee na ha nwetara nzube na-enweghị ihe mgbu. Mana ọ chọghịkwa ilekwasị anya n’ahụhụ ya nke ga-eme ka ndị mmadu funahụ ihe Chineke na-eme n’akụkọ ọ na-akọ.
Anyị na-achọkarị inwe nzube na udo na-enweghị ihe mgbu. Anyị na-echekari na ọ bụrụ na ihe adịghị aga ofuma, na ọ baghị uru. Mana ọ dịghị mgbe Jizọs kwere anyị nkwa ibi ndụ dị mfe ebe a n’ụwa a. N’ezie, Ọ mere ka anyị mata na anyị ga-enwe nsogbu n’ụwa a. Ma Ọ hapụkwara anyị olileanya na udo na Ọ meriworị ihe niile.
Ma n'agbanyeghị na Ọ meriwo ihe niile, Ọ ka na-akasi anyị obi ka anyị na-agabiga ihe mgbu nke uwa a. N’otu ebe ahụ dị na 2 Ndị Kọrint, Pọl na-ede banyere otú ha si nweta nkasi obi karịrị nke mmadụ ka ha na-agabiga ọgbaaghara nke ọnọdụ ha. Ọ debekwara ya dika ohere anyị iji kasie ndị ọzọ obi n'ụzọ ahụ.
Anyị ga-eche oké ifufe ihu na ndụ a. Ma oké ifufe ndị ahụ na-ekpughekarị ọnọdụ okwukwe anyị. Ànyị na-enye nzaghachi omume site n'ịhụ ihe nhụjuanya anyị pụtara? Ka ọ bụ na ànyị na-elekwasị anya n'ajụjụ ndị na-ezighị ezi?
Na Mak 4, anyị gụrụ banyere oké ifufe a hụrụ anya nke ndị na-eso ụzọ Jizọs chere ihu. Ikuku na ebili mmiri nọ na-asughari, ha n'enwekwa nchegbu na mmiri ga-eri ha. Ka nke a n'eme, Jizọs nọkwa n’ụgbọ mmiri na-arahụ ụra. Ya mere, ndị na-eso ụzọ Jizọs mere ihe ọtụtụ n’ime anyị ga-eme. Ha kpọtere Jizọs n’ụjọ jụọ sị:
… “Onye Ozizi, ọ́ gbasaghị Gị na mmiri ga-eri anyị?” Mak 4:38 NLT
Ọ́ bụghị ajụjụ ahụ na-anwakarị anyị ịjụ n’oge oké ifufe na ndụ anyị? Chineke, Ọ bu na Ị́ chọghị ịma?
Jizọs zara ha site n'ime ka oké ifufe ahụ daa jụụ ma maakwa nkasi obi ha aka. Ọ chebara echiche nke ọma na abụghị nanị idozi nsogbu ha kamakwa Ọ jụrụ ajụjụ banyere ọnọdụ okwukwe ha.
Mgbe anyị matara onye Jizọs bụ, anyị pụrụ inwe obi ike na Ọ na-eche banyere oké ifufe anyị, na Ọ nọnyeere anyị n’oge ha. Ya mere, anyị nwere ike inwe udo n'oge ihe mgbu? Ee. Mana okwukwe ga-esoriri—inwe ntụkwasị obi na ihe mgbu anyị nwere nzube na ọ dịghịkwa ihe na-ama Chineke anyị aka ka anyị na-agabiga ya.
Igodo: ụbọchị_isii ụbọchị_isiiBanyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A
Ọ̀ ga-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtara na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasiri anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwere ajụjụ. N'ime atụmatụ a nke Akwụkwọ Nsọ nke ụbọchị asaa, isoro usoro ozi pastọ Craig Groeschel, anyị ga-ekpughe otu anyị ga-esi chọta Udo Na-Efunahụrụ anyị nke anyị niile na-achọsi ike. Igodo: gbasara gbasara https://my. bible. com/reading-plans/23174-missing-peace https://my. bible. com/reading-plans/23174-missing-peace/day/1 23174 Bildschirmfoto 2021-11-11 um 21.55.22. png.
More