Akara Njirimara YouVersion
Akara Eji Eme Ọchịchọ

Ozi Nke Atụmatụ Ihe Ọgụgụ

Udo Funahụrụ EfunahụIhe Atụ

Missing Peace

ỤBỌCHỊ 1 NKE 7

Ifụnahụ Udo

Afọ 2020 ga-adaba n'akụkọ ihe mere eme dịka otu n'ime afọ ndị anyị kacha kpọọ asi n'ọtụtụ oge ndụ anyị. Site na ọrịa na-efe efe zuru ụwa ọnụ ruo na mmata banyere ikpe na-ezighị ezi nke agbụrụ ruo na esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nkewa, ọ bụ oge siri ike. Odi otụtụ n'ime anyị ka udo anyị ofụnahụrụ anyị, ma ọ bụ na ezuuru ya.

Ma gịnị ma ọ bụrụ na ọ bụghị ọnọdụ anyị na-ezu ohi udo anyị—gịnị ma ọ bụrụ na ha na-ekpughe nnọọ enweghị udo anyị dị bu?

Mgbe oge na-esiwanye ike, anyị nwere otu anyị si eche maka oge gara aga n'ụzọ ito ya, na-eche na ọ bụrụ na ahụmahụ anyị dị iche, mgbe ahu anyị enwee obi ụtọ ma nweta udo.

Ma, n'afọ ọ bụla, ọ dị ka anyi ka na-achọsi udo ike. Ya mere, ka anyị n'ekweta n'ezie otú oge a siri sie ike, anyị enweghị ike ịta ya ụta maka mgba ọ bụla anyị na-eche ihu. Anyị enweghịkwa ike ibelata ihe Chineke na-eme, ọbụlagodi n'ime ọgba aghara.

Ya mere, gịnị bụ udo? Olee otú anyị ga-esi achọta ya mgbe anyị dị nkewa ma na-echegbu onwe anyị na dị ejighị n’aka maka ọdịnihu?

Ozi ọma bụ na a naghị achọta udo mgbe nsogbu n'adịghị. A na-ahụ ya n’ihu Jizọs.

Ndị Efesọs 2:14 na-echetara anyị na Jizọs bịara dị ka udo anyị. Ọ bụghị nanị iji nye anyị udo kama n’ezie Ị bụ udo anyị. N’ezie, okwu Grik maka udo bụ eirene, nke pụtakwara izu oke. Jizọs abịaghi naanị ka ahụ́ ruo anyị ala ụbọchị ụfọdụ. Ọ bịara iweghachi anyị—na mmekọrịta anyị na Chineke—na izu okè.

Udo anyị jikọtara na ọnụnọ nke Chineke anyị na-adịghị agbanwe agbanwe. Ọ bụ otu ihe ahụ ụnyaahụ, taa na ruo mgbe ebighị ebi. Ọ na-adịgide adịgide. Ọ dị mma. Ọ kwesịkwara ntụkwasị obi anyị.

Anyị agaghị ahụ udo n'ọnọdụ anyị na-agbanwe agbanwe ma ọ bụ site n'ịchọ ya n'onwe anyị. Jizọs bụ udo anyị na-efunahụ anyị, mgbe anyị kwụsịrị ilekwasị anya na nsogbu anyị ma lekwasị anya na Ya, anyị ga-amalite inweta udo nke na-eche obi anyị nche ma karịa nghọta niile. Legodi anya n'ihe ncheta a sitere na Akwụkwọ Nsọ:

Ị ga-edobe n'udo zuru oke ndị niile tụkwasịrị Gị obi, ndị echiche ha niile dabere na Gị! Tukwasi Onye-nwe-anyị obi mgbe nile, n’ihi na Onye-nwe-anyị Chineke bụ Oké Nkume ebighị ebi. Aịzaya 26:3-4 NLT

Udo zuru oke na-ada ka ọmarịcha ihe ịtụnanya, ọ bụghi ya? Mana ọ na-abịa mgbe anyị dobere echiche anyị n’ebe Jizọs nọ ma nye Ya ntụkwasị obi anyị nile.

Ya mere, udo nwere ike ịdị ka ọ bu ihe furu efu ma ọ bụ dị anya. Mana nke bụ eziokwu bụ na udo bụ Mmadụ, mgbe anyị tụkwasara Ya obi ma debe echiche anyị na onye Ọ bụ, anyị ga-achọta ya. Nke ahụ apụtaghị na anyị ga-enwe obi ụtọ mgbe niile ma ọ bụ na anyị agaghị enwe nchegbu ma ọ bụ egwu. Ọ pụtara na anyị maara otú anyị ga-esi enweta udo mgbe anyị na-alụ ọgụ nke ndụ, n’ihi na udo bụ ihe si n’ọnụnọ nke Chineke apụta.

Igodo: ụbọchị_otu ụbọchị_otu https://my.bible.com/reading-plans/23174-missing-peace https://my.bible.com/reading-plans/23174-missing-peace/day/1
Ụbọchị 2

Banyere Atụmatụ Ihe Ọgụgụ A

Missing Peace

Ọ̀ ga-ekwe omume n'ezie inwe udo mgbe ndụ jupụtara na ihe mgbu? Azịza dị mkpirikpi bụ: ee, ma ọ bụghị n'ike nke anyị. N’ime otu afọ nke mere ka ọ dị anyị ka ibu arọ ọ dakwasiri anyị niile, ọtụtụ n’ime anyị nwere ajụjụ. N...

More

Anyi ga acho ikele Life.Church maka imeputa nhazi a. Maka ihe ndi ozi bara uru, biko gaa na: https://www.life.church/

YouVersion na-eji kuki gasị iji hazie ahụmịhe gị. Site na iji webụsaịtị anyị eme ihe, ị na-anabata ojiji kuki anyị gasị dịka akọwara na Iwu Anyị Mebere Banyere Ihe Ndị Ahụ Gbasara Ndụ Ndị Mmadụ Nke Ha Na-Achọghị Ka Ọha Mara